Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 22:37-51 Bible Nso (IGBOB)

37. I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum,Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.

38. Ka m'chua ndi-irom, we kpochapu ha;Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.

39. M'we me ka ha gwusia, anamamapú kwa ha, ha agaghi-ebili kwa:Ha we da n'okpuru ukwum abua.

40. I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.

41. Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha,Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.

42. Ha nāgha anya, ma ọ dighi onye nāzọputa ha;N'ebe Jehova nọ ka ha nāgha anya, ma Ọ zaghi ha.

43. Anamesu kwa ha me ka ha di ka ájá ala,Anamegwe ha me ka ha di ka apiti èzí, anametisa ha.

44. I we me ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim;I nēdebem ka m'buru isi mba nile ọzọ: Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.

45. Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum:Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti.

46. Ndi ala ọzọ nāta aru,Ke onwe-ha ihe-ọkiké, si n'ebe-nmechibido-ha puta.

47. Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa;Chineke nke oké nkume nzọputam di kwa elu:

48. Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀,Onye nēme kwa ka ndi di iche iche rida n'okpurum,

49. Onye nēme kwa ka m'si n'aka ndi-irom pua:I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem:I nānaputam n'aka madu nēme ihe ike.

50. N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba ọzọ,Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.

51. Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku:Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere,Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere rue mb͕e ebighi-ebi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 22