Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 17:2-16 Bible Nso (IGBOB)

2. m'gābiakwasi kwa ya mb͕e ike gwuru ya onwe-ya, na mb͕e aka-ya nādighi ike, m'gēme kwa ka ọ ma jijiji: ndi nile ndi ya na ha nọ gāb͕alaga kwa; m'gētib͕u kwa eze, nání ya:

3. m'gēme kwa ka ndi-ya nile laghachikute gi: dika nlaghachi madu nile ka nwoke ahu bu, onye gi onwe-gi nāchọ: ndi Israel nile gānọ n'udi.

4. Okwu ahu ziri ezi n'anya Absalom na n'anya ndi-okenye nile nke Israel.

5. Absalom we si, Biko, kpọ kwa Hushai, bú onye-Akait, ka ayi nuru kwa ihe di kwa n'ọnu ya onwe-ya.

6. Hushai we biakute Absalom, Absalom we gwa ya okwu, si, Dika okwu a si di ka Ahitofel kwuru: àyi gēme ihe o kwuru? ọ buru na ayi agaghi-eme ya, gi onwe-gi kwue.

7. Hushai we si Absalom, Ọdu nke Ahitofel duworo ub͕u a adighi nma.

8. Hushai we si, Gi onwe-gi amawo nna-gi na ndikom-ya, na ndi-dike ka ha bu, ndi nkpuru-obi-ha di ilu ka ha bu kwa, dika bear ab͕abara aka nwa n'ọhia: nna-gi bu kwa nwoke agha, ọ gaghi-esoro kwa ndi-ya nọ ọnọdu abali.

9. Le, ub͕u ya onwe-ya ezowo onwe-ya n'otù olùlù ma-ọbu n'otù nime ọnọdu-ya: o gēru kwa, mb͕e ufọdu nime ha dara na nmalite, na onye ọ bula nānu ya gāsi, Ntib͕u di n'etiti ndi ahu nke nēso Absalom.

10. Onye ahu kwa, ọbuná onye bu dìnkpà, onye obi-ya di ka obi ọdum, ọ gāb͕aze ab͕aze: n'ihi na Israel nile amawo na dike ka nna-gi bu, ndi bu dìnkpà ka ha bu kwa, bú ndi ya na ha nọ.

11. Ma anamadu ọdu ka achikọtasia Israel nile n'ebe i nọ site na Dan we rue Bia-sheba, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba: ka iru-gi nēje kwa n'agha ahu.

12. Ayi gābiakute kwa ya n'otù nime ọnọdu ebe agāchọta ya, ayi onwe-ayi gādakwasi kwa ya dika igirigi nādakwasi n'ala: ayi agaghi-eme kwa ka ọbuná otù onye fọdu n'etiti ya na n'etiti ndikom nile ndi ya na ha nọ.

13. Ma ọ buru na achikọta ya n'otù obodo, agēme kwa ka Israel nile chita udọ̀ n'obodo ahu, ayi gādọ kwa ya rue miri-iyi, rue mb͕e agaghi-ahuta ọbuná otù ajirija nkume n'ebe ahu.

14. Absalom na ndikom nile nke Israel we si, Idu-ọdu Hushai, bú onye-Akait, di nma kari idu-ọdu Ahitofel, Ma Jehova nyere iwu imebi ezi idu-ọdu nke Ahitofel, ka Jehova we me ka ihe ọjọ biakwasi Absalom.

15. Hushai we si Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, Otú a na otú a ka Ahitofel duru Absalom na ndi-okenye Israel ọdu; otú a na otú a ka mu onwem du-kwa-ra.

16. Ma ub͕u a ziganu ngwa ngwa, gosi Devid, si, Anọla ọnọdu abali a n'ala ihe nādighi nke ọzara, kama i ghaghi igabiga; ka aghara iloda eze na ndi nile ndi ya na ha nọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 17