Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 15:12-22 Bible Nso (IGBOB)

12. Absalom we zipu Ahitofel onye Gailo, bú onye nādu Devid ọdu, n'obodo-ya, bú Gailo mb͕e ọ nāchu àjà. Nkekọta ahu we di ike; ndi Israel nāba kwa uba nēje n'iru n'iru n'aka Absalom.

13. Onye nēgosi ihe we biakute Devid, si, Obi ndikom Israel di iso Absalom n'azu.

14. Devid we si ndi-orù-ya nile, ndi ya na ha nọ na Jerusalem, Bilienu, ka ayi b͕apu; n'ihi na ayi enweghi nb͕apu n'iru Absalom: menu ngwa ije, ka o we ghara ime ngwa rue ayi aru, me ka ihe ọjọ kwagide ayi, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo a.

15. Ndi-orù eze we si eze, Dika ihe nile si di nke onye-nwem, bú eze, garọputa, le, ndi-orù-gi.

16. Eze we pua, ya na ulo-ya nile ndi soro ya n'ukwu n'ukwu. Eze we rapu ndinyom iri, bú ndi-iko-ya nwayi, iche ulo.

17. Eze we pua, ya na ndi-ya nile ndi soro ya n'ukwu n'ukwu; ha we nọdu na Bet-meahak.

18. Ndi-orù-ya nile we nāgabiga n'akuku ya; ndi Keret nile, na ndi Pelet nile, na ndi Gat nile, bú nnù ndikom na ọgu iri ndi siri na Gat bia, soro ya n'ukwu n'ukwu, nāgabiga kwa n'iru eze.

19. Eze we si Itai, bú onye Gat, N'ìhi gini ka gi onwe-gi nēso kwa ayi je? laghachi, soro eze nọdu: n'ihi na onye ala ọzọ ka i bu, onye rapuru ala-ya ka i bu kwa; laghachi n'ebe-gi.

20. nyahuru bu ọbibia-gi, ọ̀ bu ta ka m'gēme gi ka i ṅagharia n'iso ayi je, n'ihi na mu onwem nēje ebe mu onwem nēje? gi laghachi, me kwa ka umu-nne-gi laghachi; ka ebere na ezi-okwu diyere gi.

21. Itai we za eze, si, Jehova nādi ndu, onye-nwem, bú eze, nādi kwa ndu, n'ezie n'ọnọdu ebe onye-nwem, bú eze, gānọ, ma-ọbu inwu ọnwu ma-ọbu idi ndu, n'ezie n'ebe ahu ka orù-gi gānọ kwa.

22. Devid we si Itai, Je gabiga. Itai onye Gat we gabiga, ya na ndikom-ya nile, na umu-ntakiri nile nke di n'aka-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 15