Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 12:18-22 Bible Nso (IGBOB)

18. O rue, n'ubọchi nke-asa, na nwa ahu nwuru. Ndi-orù Devid we tua egwu igosi ya na nwa ahu anwuwo: n'ihi na ha siri, Le, mb͕e nwa ahu nọ na ndu, ayi gwara ya okwu, ma o geghi nti n'olu-ayi: àyi gēsi kwa aṅa si ya, Nwa ahu anwuwo, o we me onwe-ya ihe ọjọ?

19. Devid we hu na ndi-orù-ya nātakwurita onwe-ha, Devid we mata na nwa ahu anwuwo: Devid we si ndi-orù-ya, Nwa ahu, ọ̀ nwuwo? Ha si, Ọ nwuwo.

20. Devid we si n'ala bilie, sa aru, te onwe-ya manu, b͕anwe uwe-nb͕okwasi-ya; o we ba n'ulo Jehova, kpọ isi ala: o we ba n'ulo-ya, jua ha, ha we d-oba nri n'iru ya, o rie.

21. Ndi-orù-ya we si ya, Gini bu ihe a nke i meworo? ọ bu n'ihi nwa ahu, mb͕e ọ nọ na ndu, ka i būru ọnu, kwa ákwá; ma mb͕e nwa ahu nwuru, i biliri rie nri.

22. Ọ si, Mb͕e nwa ahu nọ na ndu, eburum ọnu, kwa ákwá' n'ihi na m'siri, Ònye mara? eleghi anya Jehova gēmerem amara, ka nwa ahu we di ndu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 12