Devid we si n'ala bilie, sa aru, te onwe-ya manu, b͕anwe uwe-nb͕okwasi-ya; o we ba n'ulo Jehova, kpọ isi ala: o we ba n'ulo-ya, jua ha, ha we d-oba nri n'iru ya, o rie.