Ndi-orù-ya we si ya, Gini bu ihe a nke i meworo? ọ bu n'ihi nwa ahu, mb͕e ọ nọ na ndu, ka i būru ọnu, kwa ákwá; ma mb͕e nwa ahu nwuru, i biliri rie nri.