Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 12:11-23 Bible Nso (IGBOB)

11. Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ si n'ulo-gi bilie imegide i, M'gāchiri kwa ndinyom-i n'anya-gi nye ibe-gi, ọ gēso kwa ndinyom-i dina n'anya anyanwu a.

12. N'ihi na gi onwe-gi mere ya na nzuzo: ma Mu, onwem gēme ihe a n'iru Israel nile, na n'iru anyanwu.

13. Devid we si Netan, Emehiewom megide Jehova. Netan we si Devid, Jehova emewo kwa ka nmehie-gi gabiga; i gaghi-anwu.

14. Otú ọ di, n'ihi na i mewo ka ndi-iro Jehova kpọlu nkpọlu nke-uku n'okwu a, nwa-nwoke nke amuru gi aghaghi inwu kwa.

15. Netan we la n'ulo-ya.Jehova we tie nwata ahu ihe-otiti, bú nke nwunye Uraia muru nye Devid, o we nāria ọria nke-uku.

16. Devid we riosie Chineke aririọ ike bayere nwata ahu; Devid we nēbu ọnu, ba nime, dina ala ogologo abali nile.

17. Ndi-okenye ulo-ya we bilie n'akuku ya, ime ka o si n'ala bilie: ma o kweghi, o soghi kwa ha ri nri.

18. O rue, n'ubọchi nke-asa, na nwa ahu nwuru. Ndi-orù Devid we tua egwu igosi ya na nwa ahu anwuwo: n'ihi na ha siri, Le, mb͕e nwa ahu nọ na ndu, ayi gwara ya okwu, ma o geghi nti n'olu-ayi: àyi gēsi kwa aṅa si ya, Nwa ahu anwuwo, o we me onwe-ya ihe ọjọ?

19. Devid we hu na ndi-orù-ya nātakwurita onwe-ha, Devid we mata na nwa ahu anwuwo: Devid we si ndi-orù-ya, Nwa ahu, ọ̀ nwuwo? Ha si, Ọ nwuwo.

20. Devid we si n'ala bilie, sa aru, te onwe-ya manu, b͕anwe uwe-nb͕okwasi-ya; o we ba n'ulo Jehova, kpọ isi ala: o we ba n'ulo-ya, jua ha, ha we d-oba nri n'iru ya, o rie.

21. Ndi-orù-ya we si ya, Gini bu ihe a nke i meworo? ọ bu n'ihi nwa ahu, mb͕e ọ nọ na ndu, ka i būru ọnu, kwa ákwá; ma mb͕e nwa ahu nwuru, i biliri rie nri.

22. Ọ si, Mb͕e nwa ahu nọ na ndu, eburum ọnu, kwa ákwá' n'ihi na m'siri, Ònye mara? eleghi anya Jehova gēmerem amara, ka nwa ahu we di ndu.

23. Ma ub͕u a ọ nwuwo, n'ìhi gini kwa ka mu onwem gēbu ọnu? àpurum iweghachi ya ọzọ? Mu onwem nālakuru ya, ma ya onwe-ya agaghi-alaghachikutem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 12