Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 10:5-15 Bible Nso (IGBOB)

5. Ha we gosi Devid, o ziga izute ha; n'ihi na ihere nēme ndikom ahu nke-uku. Eze we si, Nọdunu na Jeriko rue mb͕e afu-ọnu-unu tolitere, mb͕e ahu ka unu gālata.

6. Umu Amon we hu na ha nēsì Devid ísì ọjọ, umu Amon we ziga, go Siria Bet-rehob na Siria Zoba, orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri ndi ji ukwu eje, na eze Meaka, ya na nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndikom Tob, bú orú nnù ndikom na nnù iri.

7. Devid we nu ya, ziga Joab, na usu-ndi-agha nile, bú ndi-dike.

8. Umu Amon we puta, do agha n'usoro n'oghere ọnu-uzọ-ama: Siria Zoba, na Rehob, na ndikom Tob, na Meaka, nọrọ onwe-ha n'ọhia.

9. Joab we hu na iru agha ahu di megide ya iru na azu, o we rọputa ufọdu n'etiti ndi nile arọputara arọputa n'Israel, do ha n'usoro izute Siria:

10. o tiye ndi Israel fọduru n'aka Abishai, bú nwa-nne-ya, we do ha n'usoro izute umu Amon.

11. Ọ si, Ọ buru na Siria akariam ike, i gābu-kwa-ram onye-nzọputa: ma ọ buru na umu Amon akaria gi ike, m'gābia kwa izọputa gi.

12. Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n'ihi ndi-ayi, na n'ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n'anya-Ya.

13. Joab na ndi soro ya we biarue agha ahu nso imegide Siria: ha we b͕alaga n'iru ya.

14. Umu Amon we hu na Siria ab͕alagawo, ha onwe-ha we b͕alaga kwa n'iru Abishai, ba n'obodo. Joab we si n'ebe umu Amon nọ lata, biarue Jerusalem.

15. Siria we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we chikọta onwe-ha n'otù.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 10