Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 10:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e ihe a gasiri, na eze umu Amon nwuru, Hanun nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2. Devid we si, M'gēmere Hanun nwa Nehash ebere, dika nna-ya merem ebere. Devid we ziga ikasi ya obi bayere nna-ya site n'aka ndi-orú-ya. Ndi-orù Devid we ba n'ala umu Amon.

3. Ma ndi-isi umu Amon siri Hanun, bú onye-nwe-ha, Devid, ọ́ nāsọpuru nna-gi n'anya-gi, na o ziteworo gi ndi-nkasi-obi? ọ̀ bughi ileputa obodo a, na iledo ya, na ikwatu ya, ka Devid zitere ndi-orù-ya ibiakute gi?

4. Hanun we were ndi-orù Devid, kọpu nkera nke afu-ọnu-ha, bipu kwa uwe-nwuda-ha n'etiti, rue otule-ha, we zilaga ha.

5. Ha we gosi Devid, o ziga izute ha; n'ihi na ihere nēme ndikom ahu nke-uku. Eze we si, Nọdunu na Jeriko rue mb͕e afu-ọnu-unu tolitere, mb͕e ahu ka unu gālata.

6. Umu Amon we hu na ha nēsì Devid ísì ọjọ, umu Amon we ziga, go Siria Bet-rehob na Siria Zoba, orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri ndi ji ukwu eje, na eze Meaka, ya na nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndikom Tob, bú orú nnù ndikom na nnù iri.

7. Devid we nu ya, ziga Joab, na usu-ndi-agha nile, bú ndi-dike.

8. Umu Amon we puta, do agha n'usoro n'oghere ọnu-uzọ-ama: Siria Zoba, na Rehob, na ndikom Tob, na Meaka, nọrọ onwe-ha n'ọhia.

9. Joab we hu na iru agha ahu di megide ya iru na azu, o we rọputa ufọdu n'etiti ndi nile arọputara arọputa n'Israel, do ha n'usoro izute Siria:

10. o tiye ndi Israel fọduru n'aka Abishai, bú nwa-nne-ya, we do ha n'usoro izute umu Amon.

11. Ọ si, Ọ buru na Siria akariam ike, i gābu-kwa-ram onye-nzọputa: ma ọ buru na umu Amon akaria gi ike, m'gābia kwa izọputa gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 10