Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 1:12-23 Bible Nso (IGBOB)

12. Ha we tie aka n'obi, kwa ákwá, bue ọnu rue anyasi, n'ihi Sọl, na n'ihi Jonatan nwa-ya, na n'ihi ndi Jehova, na n'ihi ulo Israel; n'ihi na ha dara site na mma-agha.

13. Devid we si nwa-okorọbia nēgosi ya, Òle ebe i si bia? Ọ si Nwa ọbìa, bú onye Amalek, ka m'bu.

14. Devid we si ya, Ì si aṅa ghara itu egwu iseti aka-gi ibibi onye Jehova etere manu?

15. Devid we kpọ otù nime umu-okorọbia, si, Jerue nso, dakwasi ya. O we tib͕ue ya, o we nwua.

16. Devid we si ya, Ọbara-gi dikwasi n'isi-gi; n'ihi na ọnu-gi azawo megide gi, si, Mu onwem emewo ka ọ nwua, bú onye Jehova etere manu.

17. Devid we were abù-ákwá nka bùara Sọl, bù-kwa-ra Jonatan nwa-ya:

18. Ọ we si ha zi umu Juda abù uta: le, edewo ya n'akwukwọ Jasha.

19. Israel, eb͕uwo nmá-gi n'elu ebe di elu gi!Ndi-dike esiwo aṅa da!

20. Unu egosila ya nime Gat,Unu ezisala ozi-ya n'èzí nile nke Ashkelon;Ka umu-ndinyom ndi Filistia we ghara iṅuri ọṅu,Ka umu-ndinyom nke ndi anēbìghi úgwù we ghara iṅuri ọṅu-agha.

21. Unu ugwu Gilboa,Ka igirigi ma-ọbu miri-ozuzu ghara idikwasi unu, ma-ọbu ubi nke àjà-nbuli:N'ihi na ebe ahu ka asọrọ ọta ndi-dike oyi,Ọta Sọl dika agāsi na ọ bu onye anēteghi manu.

22. Ọbara ndi eb͕uru eb͕u, abuba ndi-dike,Uta Jonatan esighi na ha la azu,Mma-agha Sọl esighi kwa lata n'efu.

23. Sọl na Jonatan bu ndi nāhurita onwe-ha n'anya, buru kwa ndi di utọ na ndu-ha,Ekewaghi kwa ha n'ọnwu-ha;Ha di garagara kari ugo,Ha di ike kari ọdum.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 1