Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 8:5-15 Bible Nso (IGBOB)

5. O rue na, mb͕e ya onwe-ya nākọrọ eze otú o mere ka onye nwuru anwu di ndu ọzọ, le, nwayi ahu, onye o mere ka nwa-ya nwoke di ndu ọzọ nētiku eze nkpu bayere ulo-ya, baye-kwa-ra ala-ya. Gihezi we si, Onye-nwem eze, nka bu nwayi ahu, nka bu kwa nwa-ya nwoke, onye Elaisha mere ka ọ di ndu ọzọ.

6. Eze we jua nwayi ahu, o we kọrọ ya akukọ ahu. Eze we nye ya otù onye nējere ya ozi, si, Nyeghachi ihe nile o nwere, na ihe-ọmume nile nke ubi site n'ubọchi ọ rapuru ala-ya, we rue ub͕u a.

7. Elaisha we biarue Damaskọs; ma Ben-hedad, bú eze Siria, nāria ọria; ewe gosi ya, si, Onye nke Chineke abiawo n'ebe a.

8. Eze we si Hazael, Were onyinye-inata-iru-ọma n'aka-gi, je izute onye nke Chineke, jua Jehova ase site n'aka-ya, si, M'gādiri ndu n'ọria nka?

9. Hazael we je izute ya, were onyinye-inata-iru-ọma n'aka-ya, bú ezi ihe nile nke Damaskọs, ibu ọgu camel abua gēbu, o we bia guzo n'iru ya, si, Nwa-gi, bú Ben-hedad eze Siria, ezìwom biakute gi, si, M'gādiri n'ọria nka?

10. Elaisha we si ya, Je, si ya, I ghaghi idiri ndu; ma Jehova emewo ka m'hu na ọ ghaghi inwu.

11. Ọ we legide ya anya, che ya iru, rue mb͕e ihere mere ya: onye nke Chineke we kwa ákwá.

12. Hazael we si, Gini mere onye-nwem nākwa ákwá? Ọ si, N'ihi na amawom ihe ọjọ nke i gēme umu Israel: i gēsu ebe nile ha ewusiri ike ọku, i gēwere kwa mma-agha b͕ue umu-okorobia-ha, i gātupia kwa umu-ha nāṅu ara, i gāb͕awa ndinyom-ha di ime afọ.

13. Hazael we si, Ma gini bu orù-gi, bú nkita nka, na ọ gēme ihe uku a? Elaisha we si, Jehova emewo ka m'hu na i gābu eze Siria.

14. O we si n'ebe Elaisha nọ la, biakute onye-nwe-ya; ọ si ya, Gini ka Elaisha siri gi? Ọ si, Ọ sirim na i ghaghi idiri ndu.

15. O rue, n'echi-ya, na ọ chiri ákwà-ob͕ub͕o, biaye na miri, b͕asa ya n'iru-ya, ọ we nwua: Hazael we buru eze n'ọnọdu ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 8