Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 5:5-14 Bible Nso (IGBOB)

5. Eze Siria we si, Je, ba, ka m'ziga-kwa-ra eze Israel akwukwọ. O we je, chiri n'aka-ya talent ọla-ọcha iri, na nnù ọla-edo iri-na-ise, na uwe nb͕anwe iri.

6. O were akwukwọ ahu biakute eze Israel, si, Ma ub͕u a, mb͕e akwukwọ a biakutere gi, le, ezìwom Neaman, bú orùm, biakute gi, ka i we me ka o si n'ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta.

7. O rue, mb͕e eze Israel guru akwukwọ ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile, si, Ọ̀ bu Chineke ka m'bu, ime ka madu nwua na ime ka madu di ndu, na nwoke a nēziterem ozi ime ka nwoke si n'ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta? ma otú ọ di, biko, maranu hu kwa na ya onwe-ya nāchọ uzọ isi megidem.

8. O rue, mb͕e Elaisha bú onye nke Chineke, nuru na eze Israel dọwara uwe-ya nile, o we zigara eze ozi, si, N'ìhi gini ka i dọwara uwe-gi nile? biko, ka ọ biakutem, ọ gāmara kwa na onye-amuma di n'Israel.

9. Neaman we bia, ya na inyinya-ya nile na ub͕ọ-ala-ya, o guzo n'ọnu-uzọ ulo Elaisha nwere.

10. Elaisha we zigara ya onye-ozi, si, Je, sa aru ub͕ò asa nime Jọdan, anu-aru-gi gālaghachikute kwa gi, i gādi kwa ọcha.

11. Ma Neaman were iwe, laba, si, Le, m'siri, Ọ ghaghi ipukutem, guzo, kpọkue aha Jehova, bú Chineke-ya, fufe aka-ya n'elu ebe ahu, me ka onye-ekpenta di ọcha soro ndi-ya zukọta.

12. Abana na Fapa, bú osimiri Damaskọs, hà adighi nma kari miri Israel nile? #m'gaghi-asa aru nime ha, di ọcha? O we chigharia, laba n'ọnuma.

13. Ndi-orù-ya we biarue nso, gwa ya okwu, si, Nnam, asi na ọ bu ihe uku onye-amuma gwara gi me, ì gaghi-eme ya? ì gēsi kwa aṅa ghara ime ya mb͕e ọ siri gi, Sa aru, di kwa ọcha?

14. O we rida, suye onwe-ya nime Jọdan ub͕ò asa, dika okwu onye nke Chineke si di: anu-aru-ya we laghachi dika anu-aru nwa-okoro ntà, o we di ọcha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 5