Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 25:24-29 Bible Nso (IGBOB)

24. Gedalaia we ṅuara ha iyi, ṅu-kwa-ra ndikom-ha, si ha, Unu atula egwu n'ihi ndi-orù ndi Kaldea: birinu n'ala, fè kwa eze Babilon òfùfè, ọ gādi-kwa-ra unu nma.

25. O rue, n'ọnwa nke-asa, na Ishmael nwa Netanaia, nwa Elishama, onye sitere na nkpuru ndi nwe ala-eze, biara, ya na ndikom iri, ha we tib͕ue Gedalaia, o we nwua, ha tib͕u-kwa-ra ndi-Ju na ndi Kaldea ndi ya na ha nọ na Mizpa.

26. Ndi-Ju nile, site n'onye ntà we rue onye uku, na ndi-isi usu-ndi-agha nile, we bilie, biarue Ijipt: n'ihi na ha turu egwu ndi Kaldea.

27. O rue, n'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke emere ka Jehoiakin, bú eze Juda, je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-orú-na-asa nke ọnwa ahu, na Evil-merodak, bú eze Babilon, n'arọ ọ malitere ibu eze, o siri n'ulo-nkpọrọ welie isi Jehoiakin, bú eze Juda;

28. o we gwa ya okwu ọma, do oche-eze-ya elu kari oche-eze nke ndi-eze ndi ya na ha nọ na Babilon.

29. O we b͕anwe uwe nkpọrọ ya, ọ we nēri nri n'iru ya mb͕e nile ubọchi nile nke ndu-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 25