Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 18:13-32 Bible Nso (IGBOB)

13. Ma n'arọ nke-iri-na-anọ nke eze, bú Hezekaia, Senakerib, bú eze Asiria, rigoro imegide obodo nile ewusiri ike nke Juda, were ha.

14. Hezekaia, bú eze Juda, we zigara eze Asiria ozi rue Lekish, si, Emehiewom; si n'ebe m'nọ laghachi: ihe i gēbom m'gēburu ya. Eze Asiria we tukwasi Hezekaia, bú eze Juda, ọgu talent ọla-ọcha iri-na-ise na orú talent ọla-edo na iri.

15. Hezekaia we nye ya ọla-ọcha nile nke anāchọta n'ulo Jehova, na n'àkù nile nke ulo eze.

16. Na mb͕e ahu ka Hezekaia bipuru ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo uku Jehova, na ogidi nile nke Hezekaia, bú eze Juda, jiri ọla-edo machita, o were ha nye eze Asiria.

17. Eze Asiria we si na Lekish zie Tatan na Rab-saris na Rabshake jekuru eze, bú Hezekaia, ha na oké usu-ndi-agha, rue Jerusalem. Ha we rigo biarue Jerusalem. Ha we rigo, bia, guzo n'akuku uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, nke di n'uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà.

18. Ha we kpọ eze òkù, Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we pukuru ha.

19. Rabshake we si ha, Biko, sinu Hezekaia, Otú a ka eze uku ahu siri, bú eze Asiria, Gini bu ntukwasi-obi a nke i ji tukwasi obi?

20. I nāsi, (ma ọ bu nání okwu eb͕ub͕ere-ọnu) Ndum-ọdu na idi-ike di iji bu agha. Ub͕u a ònye ka i tukwasiworo obi, na i nupuwo isi n'okpurum?

21. Ub͕u a, le, i tukwasiworo onwe-gi obi n'aru nkpa-n'aka amì a piara apia, bú n'aru Ijipt, nke nwoke nādabere na ya, o we ba n'ọbu-aka-ya, dua ya: otú a ka Fero, bú eze Ijipt, di n'ebe ndi nile nātukwasi ya obi nọ.

22. Ma ọ buru na unu asim, Ọ bu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi tukwasiworo obi: ọ̀ bughi Onye ahu bu onye Hezekaia wezugara ebe nile Ya di elu na ebe-ichu-àjà-ya nile, si Juda, si kwa Jerusalem, N'iru ebe-ichu-àjà nka ka unu gākpọ isi ala nime Jerusalem?

23. Ma ub͕u a, biko, were onwe-gi mere onye-nwem, bú eze Asiria, ihe-ibe, ka m'nye kwa gi nnù inyinya ise, ọ buru na i puru inyere onwe-gi ndi gānọkwasi ha.

24. Ì gēsi kwa aṅa chighari iru otù onye-ọchi-agha nke ndi-orù onye-nwem ndi kachasi ntà, tukwasiri onwe-gi obi n'aru Ijipt inwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya?

25. Ub͕u a ọ̀ bu n'ejighi Jehova ka m'rigoro imegide ebe a ibibi ya?

26. Jehovah sirim, Rigo imegide ala nka, bilie ya. Elaiakim nwa Hilkaia, na Shebna, na Joa, we si Rabshake, Biko, gwa ndi orù-gi okwu n'asusu Siria; n'ihi na ayi onwe-ayi nānu ya: akpaye-kwa-la ayi uka n'asusu ndi-Ju, na nti ndi nọ n'elu mb͕idi.

27. Rabshake we si ha, Ọ̀ bu n'ihi onye-nwe-gi na ijekuru gi ka onye-nwem ziterem ikwu okwu ndia? ọ̀ bughi n'ihi ndikom ahu ndi nānọdu n'elu mb͕idi, ka ha we soro unu rie ǹsí-ha ṅu kwa nwa-miri-ha?

28. Rabshake we guzo, were oké olu kpọ n'asusu ndi-Ju, kwue, si, Nurunu okwu eze uku ahu, bú eze Asiria.

29. Otú a ka eze siri, Unu ekwela ka Hezekaia rafue unu; n'ihi na ọ pughi inaputa unu n'aka-ya:

30. unu ekwe-kwa-la ka Hezekaia me ka unu tukwasi Jehova obi, si, Jehova aghaghi inaputa ayi, agaghi-enye kwa obodo a n'aka eze Asiria.

31. Unu egela Hezekaia nti: n'ihi na otú a ka eze Asiria siri, Merenum ihe-ngọzi, pukutekwam; ri-kwa-nu, nwoke ọ bula nkpuru vine-ya, na nwoke ọ bula nkpuru osisi fig ya, ṅu-kwa-nu, nwoke ọ bula miri olùlù-miri-ya;

32. rue mb͕e m'biara chiri unu je n'ala dika ala-unu, bú ala ọka na manya-vine ọhu, ala achicha na ubi-vine, ala manu olive na manu-aṅu, ka unu we di ndu, ghara inwu: unu ege-kwa-la Hezekaia nti, mb͕e ọ nārafu unu, si, Jehova gānaputa ayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 18