Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 13:17-25 Bible Nso (IGBOB)

17. Ọ si, Meghe window n'akuku Iru-anyanwu: o we meghe. Elaisha we si, B͕a: o we b͕a. Ọ si, Àkú nzọputa Jehova nwere, bú àkú nzọputa imegide Siria: i gētib͕u kwa Siria n'Efek, rue mb͕e i gēme ka ha gwusia.

18. Ọ si, Chiri àkú: o we chiri ha. Ọ si eze Israel, Tida n'ala: o we tie ub͕ò atọ, guzo.

19. Onye nke Chineke ahu we wesa ya iwe, si, Asi na i tiri ub͕ò ise ma-ọbu ub͕ò isi; mb͕e ahu i gēti Siria rue mb͕e i gēme ka ọ gwusia: ma ub͕u a i gēti Siria nání ub͕ò atọ.

20. Elaisha we nwua, ha we lìe ya. Ma usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Moab batara n'ala mb͕e arọ ọhu biara.

21. O rue, mb͕e ha nēli otù nwoke, le, ha huru usu ndi nāpunara madu ihe; ha we tubà nwoke ahu n'ílì Elaisha: nwoke ahu we da, metu ọkpukpu Elaisha aru, we di ndu, bilie guzo n'ukwu-ya abua.

22. Ma Hazael, bú eze Siria, meb͕uru Israel ub͕ochi nile nke Jehoahaz.

23. Jehova we mere ha amara, nwe obi-ebere n'aru ha, che ha iru, n'ihi ọb͕ub͕a-ndu-Ya nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob mere, O kweghi kwa ibibi ha, O sighi kwa n'iru Ya chupu ha rue ub͕u a.

24. Hazael, bú eze Siria, we nwua; Ben-hedad nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

25. Jehoash nwa Jehoahaz we naghachi n'aka Ben-hedad nwa Hazael obodo nile nke ọ nara n'aka Jehoahaz nna-ya n'agha. Ub͕ò atọ ka Joash tib͕uru ya, we weghachi obodo nile nke Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 13