1. Ma Ehab nwere ọgu umu-ndikom atọ na iri nime Sameria. Jihu we de akwukwọ ziga na Sameria, zigara ndi-isi Jezreel, bú ndi-okenye, ziga-kwa-ra ndi nāzù umu Ehab, si,
2. Ma ub͕u a, mb͕e akwukwọ a bara n'aka-unu, ebe umu onye-nwe-unu nọ n'etiti unu, ebe ub͕ọ-ala na inyinya di kwa n'etiti unu, na obodo ewusiri ike, na ihe-agha;
3. leputanu onye ahu nke kachasi nma, nke zi-kwa-ra ezi karisia, nime umu-ndikom onye-nwe-unu, donu ya n'elu oche-eze nna-ya, buere ulo onye-nwe-unu agha.
4. Ha we tua egwu nke-uku ri nne, si, Le, eze abua eguzoghi n'iru ya: àyi onwe-ayi gēsi kwa aṅa guzo?