Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 1:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Moab we jehie megide Israel mb͕e ọnwu Ehab gasiri.

2. Ehazaia we dapu n'ihe-ọkpukpa window nke ime-ulo-elu-ya nke di na Sameria, o we ria ọria: o ziga ndi-ozi, si ha, Jenu, jua Beal-zebub, bú chi Ekron, ase ma m'gādiri ndu n'ọria nka.

3. Ma mọ-ozi Jehova gwara Elaija, bú onye Tisbe, okwu, si, Bilie, rigo izute ndi-ozi eze Sameria, gwa ha okwu, si, Ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel, na unu onwe-unu nēje iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase?

4. Ma n'ihi nka otú a ka Jehova siri, Ihe-ndina ahu ebe i rigoro, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu. Elaija we la.

5. Ndi-ozi ahu we laghachikuru ya, ọ si ha, Gini bu nka na unu laghachiworo?

6. Ha si ya, Otù nwoke rigotara izute ayi, ọ si ayi, Jenu, laghachikuru eze nke zìri unu, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel na gi onwe-gi nēziga iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase? n'ihi ya ihe-ndina ahu ebe i rigoworo, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu.

7. Ọ si ha, Òle aha madu ọ bu, bú nwoke ahu nke rigoro izute unu, we gwa unu okwu ndia?

8. Ha si ya, Ọ bu nwoke nwere aji nke-uku, eke-kwa-ra ya ihe-ọkiké akpukpọ n'úkwù-ya. Ọ si, Elaija onye Tisbe ka ọ bu.

9. O we zigara ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. O we rigokuru ya: ma, le, ọ nānọdu n'elu ugwu. O we gwa ya okwu, si, Gi onye nke Chineke, Eze asiwo, Ridata.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 1