Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 35:10-17 Bible Nso (IGBOB)

10. Ewe dozie òfùfè ahu, ndi-nchu-àjà we guzo n'ebe-nguzo-ha, na ndi Livai n'òkè nile ha, dika ihe eze nyere n'iwu si di.

11. Ha we b͕ue anu ngabiga ahu, ndi-nchu-àjà we wusa ọbara nke ha natara n'aka-ha, ndi Livai we nāb͕a akpukpọ-ha.

12. Ha we wezuga àjà-nsure-ọku, inye ha dika nkewa nile nke ulo nke ndi bu nna umu ndi Israel si di, iweta ha nso Jehova, dika edeworo ya n'akwukwọ Moses. Otú a ka eme-kwa-ra ehi.

13. Ha we were ọku sie anu ngabiga dika ikpé-ya si di: ma ha siri ihe nsọ ọzọ nile n'ite, na n'ite isi miri, na n'ite-ofé, būru ha b͕akuru umu ndi Israel nile.

14. Emesia ha we doziere onwe-ha, dozi-kwa-ra ndi-nchu-àjà; n'ihi na ndi-nchu-àjà, bú umu Eron, nọ n'isure àjà-nsure-ọku na abuba rue abali: ndi Livai we doziere onwe-ha, dozi-kwa-ra ndi-nchu-àjà, bú umu Eron.

15. Ndi-ọbù-abù, bú umu Esaf, nọ kwa n'ebe-nguzo-ha, dika ihe Devid, na Esaf, na Himan, na Jedutun, bú onye-ọhu-uzọ eze, nyere n'iwu si di; ndi-ọnu-uzọ-ama nọ kwa n'ọnu-uzọ-ama nile ọ bula: ha enweghi ike isi n'òfùfè-ha wezuga onwe-ha, kama umu-nne-ha, bú ndi Livai, doziri ihe nye ha.

16. Ewe dozie òfùfè nile nke Jehova n'ubọchi ahu, ime ememe ngabiga, na isure àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova, dika ihe eze, bú Josaia, nyere n'iwu si di.

17. Umu Israel ndi ahuru n'ebe ahu we me ememe ngabiga na mb͕e ahu, na ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 35