isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 35 Bible Nso (IGBOB)

1. Josaia we mere Jehova ememe ngabiga nime Jerusalem: ha we b͕ue anu ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa mbu.

2. O we guzo ndi-nchu-àjà n'ihe-ndebe nile ha, me ka ha di ike ifè òfùfè ulo Jehova.

3. Ọ si ndi Livai, bú ndi nēme Israel nile ka ha ghọta ihe, ndi di nsọ n'ebe Jehova nọ, Tiyenu ib͕e nsọ n'ulo ahu nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel, wuru; ibu agaghi-adiri unu n'ubu: ub͕u a fènu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-Ya, bú Israel, òfùfè.

4. Dozi-kwa-nu onwe-unu dika ulo nna-unu-hà si di n'òkè nile unu, dika odide-akwukwọ Devid, bú eze Israel, si di, na dika odide-akwukwọ Solomon nwa-ya si di.

5. Guzo-kwa-nu n'ebe nsọ dika nkewa nile nke ulo nke ndi bu nna umu-nne-unu si di, bú umu ndi Israel, na òkè ulo nna ndi Livai.

6. B͕u-kwa-nu anu ngabiga, do kwa onwe-unu nsọ, dozi-kwa-ra umu-nne-unu ihe, ime dika okwu Jehova, site n'aka Moses, si di.

7. Josaia we bulie nye umu ndi Israel, bú ndi nile ahuru n'ebe ahu, ìgwè ewu na aturu, bú umu-aturu na umu-ewu, ha nile bu iji chu àjà-ngabiga, ọnu-ọgugu-ha ra ka orú nnù uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù oké-ehi asa na ọgu iri: ndia sitere n'àkù eze.

8. Ndi-isi-ya buli-kwa-ra onyinye-afọ-ofufo nye ndi ahu, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai. Hilkaia na Zekaraia na Jehiel, bú ndi-ndú ulo Chineke, nyere ndi-nchu-àjà nnù ewu na aturu isi na ọgu iri, na ọgu ehi iri-na-isi, iji chu àjà-ngabiga.

9. Konanaia kwa, na Shemaia na Netanel, bú umu-nne-ya, na Hashabaia na Jeiel na Jozabad, bú ndi-isi nke ndi Livai, buliri nye ndi Livai nnù ewu na aturu iri-na-abua na ọgu iri, na nnù ehi na ọgu ise, iji chu àjà-ngabiga.

10. Ewe dozie òfùfè ahu, ndi-nchu-àjà we guzo n'ebe-nguzo-ha, na ndi Livai n'òkè nile ha, dika ihe eze nyere n'iwu si di.

11. Ha we b͕ue anu ngabiga ahu, ndi-nchu-àjà we wusa ọbara nke ha natara n'aka-ha, ndi Livai we nāb͕a akpukpọ-ha.

12. Ha we wezuga àjà-nsure-ọku, inye ha dika nkewa nile nke ulo nke ndi bu nna umu ndi Israel si di, iweta ha nso Jehova, dika edeworo ya n'akwukwọ Moses. Otú a ka eme-kwa-ra ehi.

13. Ha we were ọku sie anu ngabiga dika ikpé-ya si di: ma ha siri ihe nsọ ọzọ nile n'ite, na n'ite isi miri, na n'ite-ofé, būru ha b͕akuru umu ndi Israel nile.

14. Emesia ha we doziere onwe-ha, dozi-kwa-ra ndi-nchu-àjà; n'ihi na ndi-nchu-àjà, bú umu Eron, nọ n'isure àjà-nsure-ọku na abuba rue abali: ndi Livai we doziere onwe-ha, dozi-kwa-ra ndi-nchu-àjà, bú umu Eron.

15. Ndi-ọbù-abù, bú umu Esaf, nọ kwa n'ebe-nguzo-ha, dika ihe Devid, na Esaf, na Himan, na Jedutun, bú onye-ọhu-uzọ eze, nyere n'iwu si di; ndi-ọnu-uzọ-ama nọ kwa n'ọnu-uzọ-ama nile ọ bula: ha enweghi ike isi n'òfùfè-ha wezuga onwe-ha, kama umu-nne-ha, bú ndi Livai, doziri ihe nye ha.

16. Ewe dozie òfùfè nile nke Jehova n'ubọchi ahu, ime ememe ngabiga, na isure àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova, dika ihe eze, bú Josaia, nyere n'iwu si di.

17. Umu Israel ndi ahuru n'ebe ahu we me ememe ngabiga na mb͕e ahu, na ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa.

18. Emeghi kwa ememe ngabiga dika nka n'Israel site n'ubọchi Samuel, bú onye-amuma; ọ dighi kwa eze Israel ọ bula mere ememe ngabiga dika ememe ngabiga ahu nke Josaia mere, ya na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Juda na Israel nile ahuru n'ebe ahu, na ndi bi na Jerusalem.

19. ọ bu n'arọ nke-iri-na-asatọ nke ọbubu-eze Josaia ka emere ememe ngabiga nka.

20. Mb͕e ihe a nile gasiri, mb͕e Josaia dozisiri ulo Chineke, Neko, bú eze Ijipt, rigoro ibuso Kakemish n'akuku Yufretis agha: Josaia we pua izute ya.

21. O we zigara ya ndi-ozi, si, Gini ka mu na gi nwekọrọ, eze Juda? ọ bughi imegide gi onwe-gi ka m'biaworo ta, kama ijekuru ulo ahu nke m'nēbuso ha agha: ma Chineke siri ka m'me ngwa: gi onwe-gi ra aka-gi n'ebe Chineke nọ, Onye nọyerem, ka Ọ ghara ibibi gi.

22. Ma Josaia esighi n'ebe ọ nọ chigharia iru-ya, kama o nwoghariri onwe-ya ibuso ya agha, ọ geghi kwa nti okwu Neko, bú nke sitere n'ọnu Chineke, o we bia ibu agha nime ndagwurugwu Megido.

23. Ndi-ọb͕a-uta we b͕a eze, bú Josaia; eze we si ndi-orù-ya, Bubiganum; n'ihi na ọria nāriam nke-uku.

24. Ndi-orù-ya we si n'ub͕ọ-ala ahu bubiga ya, me ka ọ nọdu n'ub͕ọ-ala nke-abua nke o nwere, ha we me ka o jerue Jerusalem; o we nwua, elìe ya n'ílì nna-ya-hà. Juda na Jerusalem nile we ruere Josaia újú.

25. Jeremaia we bùara Josaia abù-ákwá: ndi-abù ndikom na ndi-abù ndinyom nile we nēkwu okwu bayere Josaia rue ta n'abù-ákwá-ha; ha we tiye ha ibu ukpuru n'ebe Israel nọ: ma, le, edewo ha n'akwukwọ abù-ákwá.

26. Ma ihe nile Josaia mere nke fọduru, na ọlu-ebere-ya nile, dika ihe edeworo n'iwu Jehova si di,

27. na ihe nile o mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Israel na Juda.