Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 30:15-25 Bible Nso (IGBOB)

15. Ha we b͕ue anu ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa nke-abua: ma ihere mere ndi-nchu-àjà na ndi Livai, ha we do onwe-ha nsọ, webata àjà-nsure-ọku n'ulo Jehova.

16. Ha we guzo n'ebe-nguzo-ha, dika ikpé-ha si di, dika iwu Moses, bú onye nke Chineke, si di: ndi-nchu-àjà nāwusa ọbara nke ha natara n'aka ndi Livai.

17. N'ihi na ha bara uba nime nkpọkọta ahu, bú ndi nēdoghi onwe-ha nsọ: ndi Livai we buru ndi-isi n'ib͕uru onye ọ bula nādighi ọcha anu ngabiga, ido ha nsọ nye Jehova.

18. N'ihi na ọtutu ndi Israel, bú ọtutu ndi sitere n'Efraim na Manase na Isaka na Zebulun, emeghi onwe-ha ka ha di ọcha, kama ha riri oriri ngabiga otú anēdeghi ya n'akwụkwọ. Ma Hezekaia kpere ekpere bayere ha, si, Ka Jehova, bú ezi Onye ahu, kpuchiere onye ọ bula nmehie-ya,

19. bú onye doziworo obi-ya ichọ Chineke, bú Jehova, Chineke nke nna-ya-hà, ọ bu ezie na emeghi ka ọ di ọcha dika ime-ka-adi-ọcha nke ebe nsọ ayi si di.

20. Jehova we ge Hezekaia nti, me ka ndi Israel diri ndu.

21. Umu Israel ndi ahuru nime Jerusalem we me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa n'ọṅù uku: ndi Livai na ndi-nchu-àjà nēto kwa Jehova kwa-ubọchi, chiri ihe nādasi udà ike nēto Jehova.

22. Hezekaia we gwa ndi Livai nile okwu nābà ha n'obi, bú ndi nwere ezi uche bayere Jehova. Ha we rie ihe ahu akara àkà ubọchi asa ahu, nāchu àjà, bú àjà-udo, nēkele kwa Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.

23. Nkpọkọta ahu nile we nara idu-ọdu ime ememe ubọchi asa ọzọ: ha we were ọṅù me ememe ubọchi asa ọzọ.

24. N'ihi na Hezekaia, bú eze Juda, buliri nye nkpọkọta ahu nnù oke-ehi abua na ọgu iri, na nnù aturu iri-na-asa na ọgu iri; ndi-isi buli-kwa-ra nye nkpọkọta ahu nnù oke ēhi abua na ọgu iri, na orú nnù aturu na nnù ise: ndi-nchu-àjà we do onwe-ha nsọ n'uba.

25. Ha we ṅuria, bú nkpọkọta nile nke Juda, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na nkpọkọta nile ndi nēsi n'Israel bia, na ndi-ọbìa ndi nēsi n'ala Israel bia, ndi nēbi kwa na Juda.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 30