Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 28:20-25 Bible Nso (IGBOB)

20. Sọl we da n'ala ngwa ngwa ka idi-elu-ya ra, o we tua egwu nke-uku, n'ihi okwu nile nke Samuel: ike adighi kwa nime ya; n'ihi na o righi nri n'ehihie ahu nile, na n'abali ahu nile.

21. Nwayi ahu we biakute Sọl, hu na aru mara ya jijiji nke-uku, ọ si ya, Le, nwanyi nējere gi ozi egewo nti olu-gi, m'we tiye ndum n'ọbu-akam, nu kwa okwu-gi nile nke i gwaram.

22. Ma ub͕u a, biko, gi onwe-gi ge kwa nti olu nwayi nējere gi ozi, ka m'dọba kwa iberibe achicha n'iru gi; gi ri kwa, ka ike we di nime gi, mb͕e i nēje n'uzọ-gi.

23. Ma ọ juru aju, si, M'gaghi-eri ihe. Ndi-orù-ya, na nwayi ahu kwa, we rugide ya; o we ge nti olu-ha. O we si n'ala bilie, nọkwasi n'ihe-ndina.

24. Ma nwayi ahu nwere n'ulo-ya nwa-ehi emere ka ọ ma abuba; o we me ngwa, b͕ue ya, were kwa utu ọka, gwọ ya, were ya sie achicha ekoghi-eko:

25. o we bute ya nso n'iru Sọl, na n'iru ndi-orù-ya; ha we rie. Ha we bilie, la n'abali ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 28