Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 28:15-25 Bible Nso (IGBOB)

15. Samuel we si Sọl, N'ìhi gini ka i nēkweghi ka m'nọdu ndu, ime ka m'rigota? Sọl we si, Anọm na nkpà nke-uku; ndi Filistia nēbusokwam agha, ma Chineke ewezugawo Onwe-ya n'arum, Ọ dighi-azakwam ọzọ, ma ọ bu n'aka ndi-amuma ma-ọbu na nrọ: m'we kpọ gi, ka i we me ka m'mara ihe m'gēme.

16. Samuel we si, N'ìhi gini kwa ka i nājum ajuju, ebe Jehova wezugaworo Onwe-ya n'aru gi, we ghọ onye-iro-gi?

17. Ma Jehova emeworo Onwe-ya, dika O kwuru site n'akam: Jehova adọwapuwo kwa ala-eze n'aka-gi, nye ya madu-ibe-gi, bú Devid.

18. N'ihi na i geghi nti olu Jehova, i meghi kwa ka idi-ọku nke iwe-Ya dakwasi Amalek, n'ihi ya ka Jehova meworo gi ihe a ta.

19. Ọzọ kwa, Jehova gēnye Israel n'aka ndi Filistia tiyere gi: echi ka gi na umu-gi ndikom gānọye-kwa-ram: Jehova gēnye kwa ọmuma-ulo-ikwū Israel n'aka ndi Filistia.

20. Sọl we da n'ala ngwa ngwa ka idi-elu-ya ra, o we tua egwu nke-uku, n'ihi okwu nile nke Samuel: ike adighi kwa nime ya; n'ihi na o righi nri n'ehihie ahu nile, na n'abali ahu nile.

21. Nwayi ahu we biakute Sọl, hu na aru mara ya jijiji nke-uku, ọ si ya, Le, nwanyi nējere gi ozi egewo nti olu-gi, m'we tiye ndum n'ọbu-akam, nu kwa okwu-gi nile nke i gwaram.

22. Ma ub͕u a, biko, gi onwe-gi ge kwa nti olu nwayi nējere gi ozi, ka m'dọba kwa iberibe achicha n'iru gi; gi ri kwa, ka ike we di nime gi, mb͕e i nēje n'uzọ-gi.

23. Ma ọ juru aju, si, M'gaghi-eri ihe. Ndi-orù-ya, na nwayi ahu kwa, we rugide ya; o we ge nti olu-ha. O we si n'ala bilie, nọkwasi n'ihe-ndina.

24. Ma nwayi ahu nwere n'ulo-ya nwa-ehi emere ka ọ ma abuba; o we me ngwa, b͕ue ya, were kwa utu ọka, gwọ ya, were ya sie achicha ekoghi-eko:

25. o we bute ya nso n'iru Sọl, na n'iru ndi-orù-ya; ha we rie. Ha we bilie, la n'abali ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 28