Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 25:14-19 Bible Nso (IGBOB)

14. Ma otù okorọbia nime umu-okorọbia Nebal gosiri Abigail, bú nwunye Nebal, si, Le, Devid siri n'ọzara zite ndi-ozi igọzi onye-nwe-ayi; o we makwasi ha.

15. Ma ndikom ahu di nma nke-uku ka ha si me ayi, emeghi kwa ka ihere me ayi, ọ dighi kwa ihe ọ bula ayi lere anya ya na o furu efu n'ubọchi nile ayi na ha nējeghari, mb͕e ayi nọ n'ọhia:

16. ha buru ayi mb͕idi ma abali ma ehihie, ubọchi nile ayi na ha nọ mb͕e ayi nāzù ìgwè ewu na aturu.

17. Ma ub͕u a mara hu kwa ihe i gēme; n'ihi na ezubesiri ihe ọjọ ike megide onye-nwe-ayi, megide kwa ulo-ya nile: ma ya onwe-ya bu nwoke jọb͕uru onwe-ya, nke madu nāpughi igwa ya okwu.

18. Abigail we me ngwa, chiri ọgu ob͕e achicha iri, na karama-akpukpọ abua nke manya-vine juru nime ha, na aturu ise edoziri edozi, na mb͕é ọka aṅara aṅa ise, na ọgu uyọkọ nkpuru-vine amiri ami ise, na ọgu mbadamba fig iri, we bo ha inyinya-ibu.

19. Ọ we si umu-okorọbia-ya, Gabiganu n'irum; le, m'nābia n'azu unu. Ma o gosighi di-ya, bú Nebal.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 25