Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 2:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Hana we kpe ekpere, si:Ọ nātọ obi m utọ n'ime Jehova,Mpim adiwo elu n'ime Jehova:Ọnum asawo mbara n'elu ndi-irom,N'ihi na aṅuriwom ọṅu na nzọputa-Gi.

2. Ọ dighi onye di nsọ dika Jehova;N'ihi na ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Gi:Ọ dighi kwa oké nkume ọ bula dika Chineke-ayi.

3. Unu ekwula ọtutu okwu di elu elu;Ka oké okwu ghara isi n'ọnu-unu puta:N'ihi na Chineke nke ọmuma-ihe ka Jehova bu,Anēsite kwa n'aka-Ya atù omume.

4. Anyajiwo uta ndi-dike,Ma ndi nāsu ngọngọ ewerewo ike ke onwe-ha dika ihe-ọkiké.

5. Ndi afọ juru emewo onwe-ha ndi egoro ọlu n'ihi nri;Ma agu agubìwo ndi ọ nāgu:Ebe nwanyi àgà muworo umu asa;Ma nwanyi nke nwere ọtutu umu atawo aru.

6. Jehova nēme ka anwua, Ọ nēme kwa ka adi ndu:Ọ nēme ka arida rue ala-mọ, Ọ nēme kwa ka arigota.

7. Jehova nānapu madu ihe, nēme kwa ka ọ buru ọgaranya:Ọ nēme ka adi ala, Ọ nēme kwa ka adi elu.

8. Ọ nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie,Ọ nēsi n'ebe-ikpofu-ahihia welie ob͕eye elu,Ime ka ha na ndi-isi nọdu,Na ime ka ha keta oche-eze nsọpuru:N'ihi na Jehova nwe ogidi nile nke uwa,O dowo kwa elu-uwa dum madu bi n'elu ha.

9. Ukwu ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe,Ma agēme ka ndi nēmebi iwu-Ya debe ọnu-ha dū n'ọchichiri;N'ihi na ọ bughi ike ka madu gēji kari n'ike.

10. Agētipia ndi nāchọ Jehova okwu;Ọ gāmakwasi ha éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe:Jehova gēkpe nsọtu nile nke uwa ikpe;Ọ gēnye kwa eze-Ya ike,Me kwa mpi onye-Ya etere manu ka ọ di elu.

11. Elkena we la Rema rue ulo-ya. Nwata ahu we nējere Jehova ozi n'iru Ilai, bú onye-nchu-àjà.

12. Ma umu-ndikom Ilai bu ndi jọb͕uru onwe-ha; ha amaghi Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 2