Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 17:48-58 Bible Nso (IGBOB)

48. O rue, mb͕e onye Filistia ahu biliri, bia rue nso izute Devid, na Devid mere ngwa, b͕a ọsọ ijekuru usoro-agha izute onye Filistia ahu.

49. Devid we setia aka-ya tiye n'àkpà-ya, weputa otù nkume nime ya, ma ya, mata onye Filistia ahu n'egedege-iru-ya; nkume ahu we bamìe n'egedege-iru-ya, o we da kpue iru-ya n'ala.

50. Devid we were èbè, were kwa nkume, kwa onye Filistia n'ike, o we tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua; ma mma-agha adighi n'aka Devid.

51. Devid we b͕a ọsọ, guzo n'elu onye Filistia ahu, were mma-agha-ya, miputa ya n'ọbọ-ya, me ka ọ nwua, ọ were ya bipu isi-ya. Ndi Filistia we hu na dike-ha anwuwo, ha we b͕alaga.

52. Ndikom Israel na Juda we bilie, tie nkpu, chua ndi Filistia, rue ebe i nābà Gai, ru kwa ọnu-uzọ-ama Ekron. Ndi Filistia ndi emeruru aru we da n'uzọ Shaaraim, we rue Gat, ru kwa Ekron.

53. Umu Israel we si n'ichusi ndi Filistia ike lata, ha we kwakọrọ ọmuma-ulo-ikwū nile ha.

54. Devid we būru isi onye Filistia ahu, bubata ya na Jerusalem; ma ọ tọb͕ọrọ ihe-agha-ya n'ulo-ikwū-ya.

55. Ma mb͕e Sọl huru Devid ka ọ nāpu izute onye Filistia ahu, ọ siri Abnea, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, Abnea, nwà onye ka nwa-okoro nka bu? Abnea we si, Nkpuru-obi-gi nādi ndu, eze, amaghm.

56. Eze we si, Gi onwe-gi juta onye nwata-okorọbia ahu bu nwa-ya.

57. Ma mb͕e Devid si na ntib͕u onye Filistia ahu lata, Abnea kuru ya, me ka ọ bata n'iru Sọl, isi onye Filistia ahu di kwa n'aka-ya.

58. Sọl we si ya, Nwà onye ka i bu, gi nwa-okorọbia? Devid we si, Nwa orù-gi, bú Jesi, bú onye Bet-lehem, ka m'bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 17