Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 9:13-24 Bible Nso (IGBOB)

13. O we si, Gini bu obodo ndia nke i nyeworom, nwa-nnem? Ọ we kpọ ha ala Kabul, rue ta.

14. Hairam we zigara eze ọgu talent ọla-edo isi.

15. Ma nka bu ihe kpatara usu ndi nēfè òfùfè nke eze, bú Solomon, weputara; iwu ulo Jehova, na ulo nke aka ya, na Milo, na mb͕idi Jerusalem, na Hezoa, na Megido, na Gezea.

16. N'ihi na Fero, bú eze Ijipt, rigoro, were Gezea, sure ya n'ọku, b͕ue ndi Kenean ndi bi n'ọbodo ahu, were ya nye nwa-ya nwayi, bú nwunye Solomon, ka ọ buru ihe idu-ulo.

17. Solomon we wue Gezea, na Bet-horon di n'okpuru,

18. na Bealat, na Tema n'ọzara, n'ala-ya,

19. na obodo nile nke nchikọbata-ihe nke Solomon nwere, na obodo nile nke ub͕ọ-ala-ya, na obodo nile nke ndi-inyinya-ya, na ihe di Solomon ezi nma n'obi, bú nke di ya ezi nma n'obi iwu na Jerusalem, na nime Lebanon, na n'ala nile ọ nāchi.

20. Ma ndi nile fọduru n'etiti ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, ndi nēsiteghi n'umu Israel;

21. umu-ha ndi fọduru inọchi ha n'ala, ndi umu Israel nāpughi iwezuga ka ebibie ha, Solomon we si nime ha weputa usu ndi nēfè òfùfè, bú ndi-orù, rue ta.

22. Ma ọ dighi orù Solomon mere site n'umu Israel: kama ndi ahu bu ndikom agha, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-ọchi-agha-ya, na ndi-isi ub͕ọ-ala-ya na ndi-inyinya-ya.

23. Ndia bu ndi-isi nke ndi ahu edoro ndi-isi, ndi bu ndi-isi n'ozi anējere Solomon, nnù madu na ọgu asa na iri, ndi nwere ike n'aru ndi nālu ọlu n'ije-ozi ahu.

24. Otú ọ di, nwa-nwayi Fero siri n'obodo Devid rigorue ulo-ya nke Solomon wuru nye ya: mb͕e ahu ka o wuru Milo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 9