Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 20:32-43 Bible Nso (IGBOB)

32. Ha we ke ákwà-nkpe n'úkwù-ha, na udọ̀ n'isi-ha, biakute eze Israel, si, Orù-gi, bú Ben-hedad, siri, Biko, ka mu onwem di ndu. Ọ si, Ọ̀ nọ ndu ub͕u a? nwa-nnem ka ọ bu.

33. Ma ndikom ahu nāriba ama, ha we me ngwa imata ma ọ bu ihe si n'obi-ya puta; ha we si, Nwa-nne-gi, bú Ben-hedad. Ọ si, Banu n'obodo, kuta ya. Ben-hedad we pukute ya; o me ya ka ọ rigota n'ub͕ọ-ala-ya.

34. Ben-hedad we si ya, Obodo nile nke nnam nara n'aka nna-gi, m'gēnyeghachi gi ha; i gākwa-kwa-ra onwe-gi amá nime Damaskọs, dika nnam kwara nime Sameria. Ma mu onwem, ka Ehab kwuru, n'ọb͕ub͕a-ndu nka ka m'gēzilaga gi. Ya na ya we b͕a ndu, o we zilaga ya.

35. Ma otù nwoke n'etiti umu ndi-amuma siri ibe-ya n'okwu Jehova, Biko, tiem ihe. Ma nwoke ahu juru iti ya ihe.

36. O we si ya, N'ihi na i geghi nti olu Jehova, le, mb͕e i nēsi n'ebe m'nọ la, ọdum gēb͕u gi. O si n'akuku ya la, ọdum we chọta ya. b͕ue ya.

37. O we chọta nwoke ọzọ, si, Biko, tiem ihe. Nwoke ahu we tie ya ihe, nēti ya nēb͕u kwa ya mma.

38. Onye-amuma ahu we je, guzoro eze n'uzọ, nwogharia onwe-ya, nātukwasi ákwà-ike-n'isi n'anya-ya abua.

39. O rue, mb͕e eze nāgabiga, na onye ahu tikuru eze nkpu: ọ si, Orù-gi puru ba n'etiti agha; ma, le, otù nwoke wezugara onwe-ya, me ka otù nwoke biakutem, ọ si, Debe nwoke a: ọ buru na ele anya ya ma-ọli ma ahughi ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ma-ọbu na i gākwu talent ọla-ọcha.

40. O rue, mb͕e orù-gi nēme ihe n'otù ebe na ebe ọzọ, na ahughm onye ahu. Eze Israel we si ya, Otú a ka ikpé-gi si di; gi onwe-gi ekwubìwo ya.

41. O we me ngwa, wezuga ákwà-ike-n'isi n'anya-ya abua; eze Israel we mata ya na onye sitere na ndi-amuma ka ọ bu.

42. Ọ si ya, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i zilagawo nwoke ahu ka ọ pua n'aka-gi, bú onye M'wezugara ka ebibie ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ndi-gi gāla-kwa-ra ndi-ya.

43. Eze Israel we la n'ulo-ya n'obi arọ́ na nb͕aru-iru, o we ba na Sameria.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 20