Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 20:24-37 Bible Nso (IGBOB)

24. Ma me ihe a; wezuga ndi-eze, nwoke ọ bula n'ebe-ya, do ndi nāchi ala n'ọnọdu ha:

25. ma gi onwe-gi, gutara onwe-gi usu-ndi-agha, dika usu-ndi-agha nke dapunariworo gi n'agha, inyinya n'ọnọdu inyinya, na ub͕ọ-ala n'ọnọdu ub͕ọ-ala: ayi gēbuso kwa ha agha n'ala di lari, ayi aghaghi kwa idi ike kari ha. O we ge nti olu-ha, me otú a.

26. O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na Ben-hedad gukọtara ndi Siria, rigorue Efek, ibuso Israel agha.

27. Agukọta-kwa-ra umu Israel, nye ha ihe-oriri, ha we je izute ha: umu Israel we ma ulo-ikwū-ha n'iru ha dika ìgwè ewu ntà abua; ma ndi Siria juputara ala.

28. Onye nke Chineke we biarue nso, gwa eze Israel okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na Siria asiwo, Chi ugwu ka Jehova bu, ma Ọ bughi chi ndagwurugwu; n'ihi ya ka M'gēnye ìgwè uku a nile n'aka-gi, unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova.

29. Ha we nọ n'ọmuma-ulo-ikwū, ndi Israel na ncherita-iru ndi Siria, ubọchi asa. O rue, n'ubọchi nke-asa, na agha biaruru nso; umu Israel we tib͕ue Siria, orú nnù ndikom uzọ iri-na-abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje, n'otù ubọchi.

30. Ndi fọduru we b͕alaga n'Efek, rue obodo; mb͕idi obodo we dakwasi orú nnù ndikom atọ na nnù asa na ọgu iri fọduru. Ma Ben-hedad b͕alagara, ba n'obodo, n'ime-ulo nke di n'ime-ulo.

31. Ndi-orù-ya we si ya, Biko, le, ayi anuwo na ndi-eze ulo Israel, na eze ebere ka ha bu: biko, ka ayi ke ákwà-nkpe n'úkwù-ayi, na udọ̀ n'isi-ayi, pukuru eze Israel: eleghi anya ọ gēdebe gi ndu.

32. Ha we ke ákwà-nkpe n'úkwù-ha, na udọ̀ n'isi-ha, biakute eze Israel, si, Orù-gi, bú Ben-hedad, siri, Biko, ka mu onwem di ndu. Ọ si, Ọ̀ nọ ndu ub͕u a? nwa-nnem ka ọ bu.

33. Ma ndikom ahu nāriba ama, ha we me ngwa imata ma ọ bu ihe si n'obi-ya puta; ha we si, Nwa-nne-gi, bú Ben-hedad. Ọ si, Banu n'obodo, kuta ya. Ben-hedad we pukute ya; o me ya ka ọ rigota n'ub͕ọ-ala-ya.

34. Ben-hedad we si ya, Obodo nile nke nnam nara n'aka nna-gi, m'gēnyeghachi gi ha; i gākwa-kwa-ra onwe-gi amá nime Damaskọs, dika nnam kwara nime Sameria. Ma mu onwem, ka Ehab kwuru, n'ọb͕ub͕a-ndu nka ka m'gēzilaga gi. Ya na ya we b͕a ndu, o we zilaga ya.

35. Ma otù nwoke n'etiti umu ndi-amuma siri ibe-ya n'okwu Jehova, Biko, tiem ihe. Ma nwoke ahu juru iti ya ihe.

36. O we si ya, N'ihi na i geghi nti olu Jehova, le, mb͕e i nēsi n'ebe m'nọ la, ọdum gēb͕u gi. O si n'akuku ya la, ọdum we chọta ya. b͕ue ya.

37. O we chọta nwoke ọzọ, si, Biko, tiem ihe. Nwoke ahu we tie ya ihe, nēti ya nēb͕u kwa ya mma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 20