Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 20:13-20 Bible Nso (IGBOB)

13. Ma, le, otù onye-amuma biaruru Ehab, bú eze Israel, nso, si, Otú a ka Jehova siri, Ì huwo oké ìgwè madu nile a? le, anamenye ya n'aka-gi ta; i gāma kwa na Mu onwem bu Jehova.

14. Ehab we si, Sìte n'aka onye? Ọ si, Otú a ka Jehova siri, Site n'aka umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi. Ọ si, Ònye gāmalite agha ahu? Ọ si, Gi onwe-gi.

15. O we gukọta umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, ha we di ọgu iri-na-otù na iri na abua: mb͕e agukọtasiri ha ọ gukọta ndi-ya nile, bú umu Israel nile, nnù iri-na-asa na ọgu iri.

16. Ha we pua n'etiti-ehihie. Ma Ben-hedad nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo-ntu-ya, ya onwe-ya na ndi-eze, bú orú ndi-eze na iri na abua ahu ndi nēyere ya aka.

17. Umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi we buru uzọ pua; Ben-hedad we zipu, ha we gosi ya, si, Ndikom esiwo na Sameria puta.

18. Ọ si, Ọ buru na ọ bu okwu udo ka ha putaworo, jidenu ha na ndu: ọ buru kwa na ọ bu ibu agha ka ha putaworo, jidenu ha na ndu.

19. Ma ndia siri n'obodo pua, bú umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, na usu-ndi-agha ndi soro ha n'azu.

20. Ha we tib͕ue, nwoke ọ bula nwoke-ibe-ya; ndi Siria we b͕alaga, Israel we chua ha n'azu: Ben-hedad, bú eze Siria, we wepuga onwe-ya n'elu inyinya, ya na ndi-inyinya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 20