Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 14:9-22 Bible Nso (IGBOB)

9. ma i mewo ihe ọjọ kari ndi nile buru gi uzọ, i we je mere onwe-gi chi ọzọ di iche iche, na arusi a kpuru akpu, ikpasum iwe, i we tufuem n'azu gi:

10. n'ihi nka, le, M'nēme ka ihe ọjọ biakute ulo Jeroboam, M'gēbipu kwa n'aru Jeroboam nwa-nwoke ọ bula, onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel, M'gēkpochapu kwa nke fọduru nke ulo Jeroboam, dika madu si ekpochapu ǹsí-anu, rue mb͕e agēkpochapuzu ya.

11. Onye nke Jeroboam nke nwuru anwu n'obodo, nkita gēri ya; onye nke nwuru anwu n'ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya: n'ihi na Jehova ekwuwo ya.

12. Ma gi onwe-gi bilie, la n'ulo-gi: mb͕e ukwu-gi nābà n'obodo, nwata ahu gānwu kwa.

13. Ma Israel nile gētiri ya aka n'obi, lìe ya; n'ihi na onye a, nání ya, nime ndi Jeroboam nwere gābiaru ílì: n'ihi na ahuru nime ya ezi ihe n'ebe Jehova, bú Chineke Israel, nọ, n'ulo Jeroboam.

14. Jehova gēme kwa ka otù eze Israel biliere Ya, onye gēbipu ulo Jeroboam ubọchi a: ma gini? ọbuná ub͕u a.

15. Jehova gētib͕u kwa Israel, dika amì nēme nkpatu nime miri; Ọ gēropu kwa Israel n'ezi ala nka, nke O nyere ndi bu nna-ha, Ọ gēfesa kwa ha n'ofè Osimiri; n'ihi na ha emewo Asherim-ha, nākpasu Jehova iwe.

16. Ọ gārara kwa Israel nye n'ihi nmehie Jeroboam nile, nke o mehieworo, na nke o ji me ka Israel mehie.

17. Nwunye Jeroboam we bilie, la, biarue Tiaza: mb͕e nwayi ahu nābata na nbata-uzọ ulo, nwa-okoro ahu we nwua.

18. Israel nile we lìe ya, tiere ya aka n'obi; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka orù-Ya, bú Ahaija onye-amuma.

19. Ma ihe nile nke fọduru nke Jeroboam mere, ka o si bu agha, na ka o si buru eze, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel.

20. Ubọchi nke Jeroboam buru eze we di orú arọ na abua: o we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, Nedab, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.

21. Ma Rehoboam, bú nwa Solomon, bu eze na juda. Rehoboam b͕ara ọgu arọ abua na otù mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri na asa nime Jerusalem, bú obodo nke Jehova rọputara n'etiti ebo nile nke Israel, itiye aha-Ya n'ebe ahu. Aha nne-ya bu Neama, bú nwayi Amon.

22. Juda we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; ha we were nmehie-ha nile nke ha mehiere kpasue Ya ekworo, kari ihe nile ndi bu nna-ha mere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 14