Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 14:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Na mb͕e ahu Abaija nwa Jeroboam riara ọria.

2. Jeroboam we si nwunye-ya, Biko, bilie, nwogharia onwe-gi, ka aghara imara na gi onwe-gi bu nwunye Jeroboam: i gēje kwa Shailo; le, n'ebe ahu ka Ahaija, bú onye-amuma, nọ; onye ahu kwuru okwu bayerem na m'gābu eze ndi nka.

3. Chiri kwa n'aka-gi ob͕e achicha iri, na achicha ntà, na karama manu-aṅu, jekuru ya: onye ahu gēgosi gi ihe gēme nwa-okoro.

4. Nwunye Jeroboam we me otú a, we bilie, je Shailo, ba n'ulo Ahaija. Ma Ahaija apughi ihu uzọ; n'ihi na anya-ya guzoro eguzo n'ihi agadi-ya.

5. Ma Jehova siri Ahaija, Le, nwunye Jeroboam nābia iju ase bayere nwa-ya nwoke n'aka-gi; n'ihi na ọ nāria ọria: otú a na ọtú a ka i gāgwa ya: ọ gēru kwa, mb͕e ọ batara, na nwayi ahu ganēme onwe-ya dika onye ala ọzọ.

6. O rue, mb͕e Ahaija nuru olu ukwu-ya ka ha nāzọ, mb͕e ọ nābata n'ọnu-uzọ, na ọ siri, Bata, nwunye Jeroboam; n'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nēme onwe-gi dika onye ala ọzọ? ma mu onwem bu onye-ozi siri ike n'ebe i nọ.

7. Je, si Jeroboam, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: N'ihi na esim n'etiti ndim welie gi elu, me gi onye-ndú ndim, bú Israel,

8. we dowapu ala-eze n'ulo Devid, nye gi ya: ma i dighi ka orùm, bú Devid, onye debere ihe nile M'nyere n'iwu, o were obi-ya nile jesom, ime nání ihe ziri ezi n'anyam;

9. ma i mewo ihe ọjọ kari ndi nile buru gi uzọ, i we je mere onwe-gi chi ọzọ di iche iche, na arusi a kpuru akpu, ikpasum iwe, i we tufuem n'azu gi:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 14