Ma Jehova siri Ahaija, Le, nwunye Jeroboam nābia iju ase bayere nwa-ya nwoke n'aka-gi; n'ihi na ọ nāria ọria: otú a na ọtú a ka i gāgwa ya: ọ gēru kwa, mb͕e ọ batara, na nwayi ahu ganēme onwe-ya dika onye ala ọzọ.