Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 13:11-23 Bible Nso (IGBOB)

11. Ma otù onye-amuma, bú agadi, bi na Bet-el; nwa-ya we bia, kọrọ ya akukọ omume nile nke onye nke Chineke mere ubọchi ahu na Bet-el: okwu nile ọ gwara eze, ha we kọrọ nna-ha akukọ okwu ahu.

12. Nna-ha we gwa ha okwu, si, Òle nke bu uzọ o jere? Ma umu-ya ndikom ahuwo uzọ nke onye nke Chineke ahu jere, bú onye siri na Juda bia.

13. O we si umu-ya, Jikwaranum inyinya-ibu. Ha we jikwara ya inyinya-ibu: ọ nọkwasi n'elu ya.

14. O we jeso onye nke Chineke ahu n'azu, chọta ya ka ọ nānọdu n'okpuru osisi terebinth: ọ si ya, Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye Chineke ahu nke siri na Juda bia? Ọ si, Ọ bu mu onwem.

15. Ọ si ya, Sorom je n'ulo, ri kwa nri.

16. Ọ si, Apughm isoro gi laghachi, ma-ọbu isoro gi ba n'ulo: m'gaghi-esoro kwa gi ri nri ma-ọbu iṅu miri n'ebe a:

17. n'ihi na okwu rurum nti n'okwu Jehova, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri, n'ebe ahu, alaghachi-kwa-la ila n'uzọ ahu i jere nime ya.

18. Ọ si ya, Mu onwem bu kwa onye-amuma dika gi; mọ-ozi we gwam okwu n'okwu Jehova, si, Me ka o soro gi lata n'ulo-gi, ka o we rie nri ṅu kwa miri. Ma ọ gwara ya okwu-ugha.

19. O we soro ya laghachi, rie nri n'ulo-ya, ṅu kwa miri.

20. O rue, mb͕e ha abua nānọdu nēri ihe na table, na okwu Jehova ruru onye-amuma ahu nti, bú onye mere ka ọ laghachi:

21. ọ kpọ onye nke Chineke ahu òkù, bú onye siri na Juda bia, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i nupuwo isi n'okwu-ọnu Jehova, i we ghara idebe ihe enyere n'iwu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n'iwu,

22. i we laghachi, rie nri, ṅua miri, n'ebe nke Ọ gwara gi okwu, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri; ozu-gi agaghi-abiaru ílì nna-gi-hà.

23. O rue, mb͕e o risiri nri, mb͕e ọ ṅusi-kwa-ra ihe-ọṅuṅu, na o were inyinya-ibu jikwara ya, bú onye-amuma ahu nke o mere ka ọ laghachi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 13