Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 12:19-31 Bible Nso (IGBOB)

19. Israel we jehie megide ulo Devid, rue ta.

20. O rue, mb͕e Israel nile nuru na Jeroboam alatawo, ha we zìe kpọ ya ibia na nzukọ-ha, ha we me ya eze Israel nile: ọ dighi ebo ọ bula soro ulo Devid, ma-ọbughi ebo Juda, nání ya.

21. Rehoboam we biarue Jerusalem, kpọkọta ulo Juda nile, na ebo Benjamin, orú nnù ndikom orú uzọ na abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nēbu agha, ibuso ulo Israel agha, iweghachiri Rehoboam nwa Solomon ala-eze.

22. Okwu Chineke we rue Shemaia nti, bú onye nke Chineke, si,

23. Gwa Rehoboam nwa Solomon, bú eze Juda, gwa kwa ulo nile nke Juda na Benjamin, gwa kwa ndi Israel fọduru, okwu, si,

24. Otú a ka Jehova siri, Unu arigola, unu ebuso-kwa-la umu-nne-unu, bú umu Israel, agha: laghachinu, nwoke ọ bula n'ulo-ya; n'ihi na n'ebe M'nọ ka ihe a siteworo. Ha we nu okwu Jehova, laghachi azu n'ulo-ha, dika okwu Jehova si di.

25. Jeroboam we wue Shekem n'ugwu Efraim, biri n'ebe ahu; o si n'ebe ahu pua, wue Penuel.

26. Jeroboam we si n'obi-ya, Ub͕u a ka ala-eze gālaghachikuru ulo Devid:

27. ọ buru na ndi nka arigo ichu àjà n'ulo Jehova na Jerusalem, obi ndi nka gālaghachikuru kwa onye-nwe-ha, bú Rehoboam eze Juda; ha gēb͕ukwam, laghachikuru Rehoboam, bú eze Juda.

28. Eze we me ka adua ya ọdu, o we me umu-ehi abua nke ọla-edo; ọ si ha, Unu arigozuwo Jerusalem; le chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.

29. Ọ dọba otù nime Bet-el, tiye nke-ọzọ nime Dan.

30. Ihe a we ghọ nmehie: ndi Israel we je n'iru otù nime ha, rue Dan.

31. O me ulo nke ebe di elu, me kwa ndi-nchu-àjà sitere n'ọnu-ọgugu ndi Israel nile, ndi nēsiteghi n'umu Livai.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 12