Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 5:18-26 Bible Nso (IGBOB)

18. Umu Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, nime ndi bu dìnkpà, ndikom nēbu ọta na mma-agha, nāzọgide kwa uta ikwe ya, ndi ezíwo-kwa-ra ibu agha, di orú nnù ndikom uzọ ise na nnù iri-na-otù na ọgu iri-na-asatọ, ndi nāpukuru usu-ndi-agha.

19. Ha we buso ndi Haga, na Jetua, na Nafish, na Nodab, agha.

20. Ewe yere ha aka imegide ha, ewe nye ndi Haga na ndi nile ha na ha yikọrọ n'aka-ha: n'ihi na ọ bu Chineke ka ha kpọkuru n'agha ahu, O we kwe ka ha riọta ihe ha riọrọ; n'ihi na ha tukwasiri Ya obi.

21. Ha we chiri anu-ulo-ha n'agha: camel-ha orú nnù uzọ isi na nnù ise, na ìgwè ewu na aturu orú nnù orú uzọ na uzọ iri-na-otù na nnù ise, na inyinya-ibu nnù ise, na madu orú nnù uzọ iri-na-abua na nnù iri.

22. N'ihi na ọtutu ndi eb͕uru eb͕u dara, n'ihi na agha ahu sitere na Chineke. Ha we biri n'ọnọdu ha rue mb͕e emere ka ha je biri n'ala ọzọ.

23. Umu nkera ebo Manase biri kwa n'ala ahu: site na Beshan rue Beal-heamon na Senia na ugwu Heamon ka ndi ahu bara uba.

24. Ma ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, bú Ifa, na Ishi, na Eliel, na Azriel, na Jeremaia, na Hodavaia, na Jahdiel, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom amara aha-ha, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha.

25. Ha we mekpue emekpu megide Chineke nke ndi bu nna-ha, soro chi nile nke ndi ala ahu kwa iko, bú ndi Chineke kpochapuru n'iru ha.

26. Chineke Israel we kpọte mọ Pul, bú eze Asiria, na mọ Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, o we me ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, o we me ka ha biarue Hala, na Haboa, na Hara, na osimiri Gozan, rue ta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 5