Umu Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, nime ndi bu dìnkpà, ndikom nēbu ọta na mma-agha, nāzọgide kwa uta ikwe ya, ndi ezíwo-kwa-ra ibu agha, di orú nnù ndikom uzọ ise na nnù iri-na-otù na ọgu iri-na-asatọ, ndi nāpukuru usu-ndi-agha.