Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 26:28-32 Bible Nso (IGBOB)

28. Ya na ihe nile Samuel, bú onye-ọhu-uzọ, na Sọl nwa Kish, na Abnea nwa Nea, na Joab nwa Zeruaia, doro nsọ; onye ọ bula nke doro ihe nsọ, ọ di n'aka Shelomit na umu-nne-ya.

29. Nke ndi Izha, Kenania na umu-ya ndikom diri ozi èzí n'ebe Israel nọ, ibu ndi-odozi-okwu na ibu ndi-ikpe.

30. Nke ndi Hebron, Hashabaia na umu-nne-ya, bú ndi-dìnkpà, nnù ndikom anọ na ọgu ise, bu ndi-isi nlekọta Israel n'ofè Jọdan n'akuku Ọdida-anyanwu; bayere ozi nile nke Jehova, baye-kwa-ra òfùfè eze.

31. Nke ndi Hebron, Jerija bu onye-isi, ọbuná nke ndi Hebron, dika osuso-ọmumu nile ha si di n'ulo nke ndi bu nna. N'arọ nke-ọgu-abua Devid bu eze ka achọrọ ha, ewe chọta nime ha ndi-dike bu dìnkpà nime Jeza Gilead.

32. Ma umu-nne-ya, bú ndi-dìnkpà, di nnù ndikom isi na ọgu iri-na-ise, ndi-isi ulo nke ndi bu nna; Devid, bú eze, we me ka ha buru ndi-nlekọta ndi Reuben na ndi Gad na nkera ebo ndi Manase, bayere ihe nile nke Chineke na ihe nile nke eze.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 26