1. Ekè-kwa-ra umu Eron òkè nile ha. Umu-ndikom Eron; Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.
2. Nedab na Abaihu we nwua n'iru nna-ha, ha enweghi kwa umu-ndikom: Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà.
3. Devid we kè ha, ya na Zedok, onye sitere n'umu Eleeza, na Ahimelek, sitere n'umu Itama, dika ihe-nlekọta-ha si di n'òfùfè-ha.
4. Ewe chọta ọtutu umu Eleeza ibu ndi-isi nke ndikom di ike kari umu Itama; ewe kè ha otú a: umu Eleeza nwere ndi-isi ulo nke ndi bu nna iri na isi; umu Itama nwe-kwa-ra asatọ, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.
5. Ewe kè ha n'ife-nzà, ndi Eleeza na ndi Itama n'otù; n'ihi na ndi-isi ebe nsọ di, na ndi-isi nke Chineke, ndi sitere n'umu Eleeza na n'etiti umu Itama.
6. Shemaia nwa Netanel, bú ode-akwukwọ, onye sitere na ndi Livai, we de ha n'akwukwọ n'iru eze, na ndi-isi, na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Ahimelek nwa Abaiata, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai: otù ulo nna nke Eleeza ka ejidere, ejide-kwa-ra otù nke Itama.
7. Ife-nzà mbu we putara Jehoiarib, nke-abua putara Jedaia;
8. nke-atọ putara Harim, nke-anọ putara Seorim;
9. nke-ise putara Malkija, nke-isi putara Mijamin;
10. nke-asa putara Hakoz, nke-asatọ putara Abaija;
11. nke-iteghete putara Jeshua, nke-iri putara Shekania;
12. nke-iri-na-otù putara Elaiashib, nke-iri-na-abua putara Jakim;
13. nke-iri-na-atọ putara Hupa, nke-iri-na-anọ putara Jeshebeab;
14. nke iri-na-ise putara Bilga, nke-iri-na-isi putara Imea;
15. nke-iri-na-asa putara Hezia, nke-iri-na-asatọ putara Hapizez;