Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 24:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. Ekè-kwa-ra umu Eron òkè nile ha. Umu-ndikom Eron; Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.

2. Nedab na Abaihu we nwua n'iru nna-ha, ha enweghi kwa umu-ndikom: Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà.

3. Devid we kè ha, ya na Zedok, onye sitere n'umu Eleeza, na Ahimelek, sitere n'umu Itama, dika ihe-nlekọta-ha si di n'òfùfè-ha.

4. Ewe chọta ọtutu umu Eleeza ibu ndi-isi nke ndikom di ike kari umu Itama; ewe kè ha otú a: umu Eleeza nwere ndi-isi ulo nke ndi bu nna iri na isi; umu Itama nwe-kwa-ra asatọ, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.

5. Ewe kè ha n'ife-nzà, ndi Eleeza na ndi Itama n'otù; n'ihi na ndi-isi ebe nsọ di, na ndi-isi nke Chineke, ndi sitere n'umu Eleeza na n'etiti umu Itama.

6. Shemaia nwa Netanel, bú ode-akwukwọ, onye sitere na ndi Livai, we de ha n'akwukwọ n'iru eze, na ndi-isi, na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Ahimelek nwa Abaiata, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai: otù ulo nna nke Eleeza ka ejidere, ejide-kwa-ra otù nke Itama.

7. Ife-nzà mbu we putara Jehoiarib, nke-abua putara Jedaia;

8. nke-atọ putara Harim, nke-anọ putara Seorim;

9. nke-ise putara Malkija, nke-isi putara Mijamin;

10. nke-asa putara Hakoz, nke-asatọ putara Abaija;

11. nke-iteghete putara Jeshua, nke-iri putara Shekania;

12. nke-iri-na-otù putara Elaiashib, nke-iri-na-abua putara Jakim;

13. nke-iri-na-atọ putara Hupa, nke-iri-na-anọ putara Jeshebeab;

14. nke iri-na-ise putara Bilga, nke-iri-na-isi putara Imea;

15. nke-iri-na-asa putara Hezia, nke-iri-na-asatọ putara Hapizez;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 24