Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 22:8-19 Bible Nso (IGBOB)

8. Okwu Jehova we ruem nti, si, I wusiwo ọbara ri nne, i buwo kwa agha uku di iche iche: i gaghi-ewuru aham ulo, n'ihi na i wusiwo ọtutu ọbara n'uwa n'irum:

9. le, agāmuru gi nwa-nwoke, onye ahu gābu nwoke izu-ike; M'gēme kwa ka o zuru ike pua n'aka ndi-iro-ya nile buruburu: n'ihi na Solomon ka aha-ya gābu, M'gēnye kwa Israel udo na idi-jū n'ubọchi-ya:

10. onye ahu gēwuru aham ulo; ya onwe-ya gāburum nwa, Mu onwem gābu-kwa-ra ya nna; M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike n'elu Israel rue mb͕e ebighi-ebi.

11. Ub͕u a, nwam, ka Jehova nọyere gi; gi nwe kwa uche, wue ulo Jehova, bú Chineke-gi, dika O kwuworo bayere gi.

12. Nání Jehova nye gi ezi uche na nghọta, nye gi iwu bayere Israel; ọbuná idebe iwu Jehova, bú Chineke-gi.

13. Mb͕e ahu ka i gēnwe uche, ọ buru na i lezie anya ime ukpuru nile na ikpé nile nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere Israel: di ike, nwe kwa ume; atula egwu, atu-kwa-la ujọ.

14. Ma, le, na nwedam edoziworom ulo Jehova ọla-edo orú nnù talent uzọ iri-na-abua na nnù iri, na ọla-ọcha orú nnù talent ọgu uzọ isi na uzọ ise; ma ọla na ígwè enweghi ọtùtù; n'ihi na o riri nne: edoziwokwam osisi na nkume; i gātukwasi kwa ha ihe.

15. Ndi nēje ozi ri-kwa-ra nne n'aka-gi, ndi nāwa nkume na osisi na ndi-ọ̀kà nkume na osisi, na ndi nile mara ihe n'ije-ozi ọ bula;

16. ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla, na ígwè, enweghi ọnu-ogugu; bilie, lua ọlu, ka Jehova nọyere kwa gi.

17. Devid we nye ndi-isi nile nke Israel iwu iyere Solomon nwa-ya aka, si,

18. Jehova, bú Chineke-unu, Ọ̀ nọyeghi unu? Ọ̀ meghi kwa ka unu zuru ike buruburu? n'ihi na Ọ nyewo n'akam ndi bi n'ala; ebudawo kwa ala n'iru Jehova, na n'iru ndi-Ya.

19. Ub͕u a werenu obi-unu na nkpuru-obi-unu nye ichọ Jehova, bú Chineke-unu; bili-kwa-nu, wue ebe nsọ Jehova, bú Chineke, ibubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na ihe nsọ nile nke Chineke, n'ulo nke anēwuru aha Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 22