Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 19:3-9 Bible Nso (IGBOB)

3. Ma ndi-isi umu Amon siri Hanun, Devid, ọ̀ nāsọpuru nna-gi n'anya-gi, na o ziteworo gi ndi-nkasi-obi? ọ̀ bughi ileputa ala-ayi, na ikwatu ya, na iledo ya, ka ndi-orù-ya biakutere gi?

4. Hanun we were ndi-orù Devid, kọpu ha afu-ọnu, bipu kwa uwe-nwuda-ha n'etiti, rue otule-ha, we zilaga ha.

5. Ewe je gosi Devid ihe bayere ndikom ahu. O we ziga izute ha; n'ihi na ihere nēme ndikom ahu nke-uku. Eze we si, Nọdunu na Jeriko rue mb͕e afu-ọnu-unu tolitere, mb͕e ahu ka unu gālata.

6. Umu Amon we hu na ha emewo onwe-ha ka ha nēsi Devid ísì ọjọ, Hanun na umu Amon we ziga nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri igotara onwe-ha ub͕ọ-ala na ndi-inyinya site na Mesọpọtemia, site kwa na Siria Meaka, site kwa na Zoba.

7. Ha we gotara onwe-ha orú nnù ub͕ọ-ala uzọ anọ, na eze Meaka na ndi-ya; ha we bia ma ulo-ikwū-ha n'iru Medeba. Umu Amon si-kwa-ra n'obodo nile ha chikọta onwe-ha, bia ibu agha.

8. Devid we nu ya, ziga Joab, na usu-ndi-agha nile, bú ndi-dike.

9. Umu Amon we puta, do agha n'usoro n'ọnu-uzọ obodo: ma ndi-eze ndi biara nọrọ onwe-ha n'ọhia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 19