Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 19:16-19 Bible Nso (IGBOB)

16. Siria we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we ziga ndi-ozi, me ka Siria ndi nọ n'ofè Osimiri puta, Shofak onye-isi usu-ndi-agha Hedareza je-kwa-ra n'iru ha.

17. Ewe gosi Devid; o we chikọta Israel nile, gabiga Jọdan, biakute ha, do agha n'usoro megide ha. Devid we do ndi-ya n'usoro izute Siria, ha we buso ya agha.

18. Siria we b͕alaga n'iru Israel; Devid we b͕ue n'etiti ndi Siria ndikom nke nnù ub͕ọ-ala iri-na-asa na ọgu iri, na orú nnù ndikom uzọ ise, bú ndi ji ukwu eje, o me-kwa-ra ka Shofak, bú onye-isi usu-ndi-agha-ha, nwua.

19. Ndi-orù Hedareza we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we me ka ha onwe-ha na Devid di n'udo, we fè ya òfùfè: Siria ekweghi kwa izọputa umu Amon ọzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 19