Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 19:12-17 Bible Nso (IGBOB)

12. Ọ si, Ọ buru na Siria akariam ike, i gābu-kwa-ram onye-nzọputa: ma ọ buru na umu Amon akaria gi ike, m'gāzọputa kwa gi.

13. Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n'ihi ndi-ayi, na n'ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n'anya-Ya.

14. Joab na ndi soro ya we biarue nso n'iru ndi Siria ibu agha; ha we b͕alaga n'iru ya.

15. Umu Amon we hu na Siria ab͕alagawo, ha onwe-ha we b͕alaga kwa n'iru Abishai nwa-nne-ya, ba n'obodo. Joab we biarue Jerusalem.

16. Siria we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we ziga ndi-ozi, me ka Siria ndi nọ n'ofè Osimiri puta, Shofak onye-isi usu-ndi-agha Hedareza je-kwa-ra n'iru ha.

17. Ewe gosi Devid; o we chikọta Israel nile, gabiga Jọdan, biakute ha, do agha n'usoro megide ha. Devid we do ndi-ya n'usoro izute Siria, ha we buso ya agha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 19