Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 15:15-22 Bible Nso (IGBOB)

15. Umu ndi Livai we were nkpa-n'aka-ya abua būru ib͕e Chineke n'ubu-ha n'elu ha, dika Moses nyere iwu, dika okwu Jehova si di.

16. Devid we si ndi-isi ndi Livai ka ha me umu-nne-ha, bú ndi-ọbù-abù, ka ha guzo chiri ihe abù, bú une, na ubọ-akwara, na ájà, nēme ka anu udà-ha, iweli olu n'elu n'ihi ọṅù.

17. Ndi Livai we guzo Himan nwa Joel; na site n'umu-nne-ya, Esaf nwa Berekaia; na site n'umu Merari, bú umu-nne-ha, Itan nwa Kushaia;

18. tiye-kwa-ra ha umu-nne-ha, bú ndi nke usoro nke-abua, Zekaraia, na Ben, na Jaaziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Benaia, na Maaseia, na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, bú ndi-ọnu-uzọ-ama.

19. Na ndi-ọbù-abù, bú Himan, na Esaf, na Itan, chiri ájà ọla ime ka anu udà-ha;

20. na Zekaraia, na Aziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Maaseia, na Benaia, chiri une nke dabàra n'olu umu-ab͕ọghọ;

21. na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, na Azazaia, chiri ubọ-akwara nke dabàra n'octave, ibu ndi-isi nke ndi-abù.

22. Ma Kenania, bú onye-isi ndi Livai, bu isi n'ibū ibu ahu: ọ dọrọ aka na nti n'ibū ibu ahu, n'ihi na onye nwere nghọta ka ọ bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 15