Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 12:32-40 Bible Nso (IGBOB)

32. Site kwa n'umu Isaka, bú ndi mara nghọta bayere mb͕e ahu nile, imara ihe Israel gēme; ndi-isi-ha bu ọgu iri; umu-nne-ha nile nēme kwa dika okwu-ọnu-ha si di.

33. Site na Zebulun, ndi nāpukuru usu-ndi-agha, ndi nēdo agha n'usoro, ndi chiri ihe-agha nile, orú nnù uzọ isi na nnù ise; ndi nēdo onwe-ha n'usoro, nēnweghi obi abua.

34. Site kwa na Naftali, nnù ndi-isi abua na ọgu iri, orú nnù ndikom uzọ anọ na nnù iri-na-abua na ọgu iri so-kwa-ra ha nāchi uta na ube.

35. Site kwa na ndi Dan, bú ndi nēdo agha n'usoro, orú nnù uzọ atọ na nnù iri-na-otù na ọgu iri.

36. Site kwa n'Asha, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha ido agha n'usoro, orú nnù uzọ ise.

37. Site kwa n'ofè Jọdan, site n'umu Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, bú ndi nāchi ihe nile nke usu-ndi-agha iji bu agha, orú nnù uzọ iri-na-ise.

38. Ndia nile, bú ndikom agha, ndi nēdo agha n'usoro, were obi zuru okè biarue Hebron, ime Devid eze Israel nile: ọzọ kwa, ndi Israel nile nke fọduru nwere otù obi ime Devid eze.

39. Ha na Devid we nọ n'ebe ahu ubọchi atọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu: n'ihi na umu-nne-ha doziri ha ihe.

40. Ọzọ kwa, ndi bi ha nso, rue Isaka na Zebulun na Naftali, nēweta achicha n'elu inyinya-ibu na n'elu camel, na n'elu inyinya mule, na n'elu ehi, ihe-oriri nke utu ọka, na mbadamba fig, na uyọkọ nkpuru-vine amiri ami, na manya-vine, na manu, na ìgwè ehi, na ìgwè ewu na aturu n'uba: n'ihi na ọṅù di n'Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 12