Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 11:19-34 Bible Nso (IGBOB)

19. si, Ya burum ihe-árú sitere na Chinekem, ime ihe a: #m'gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n'aka-ha je? n'ihi na ha ji ndu-ha n'aka-ha kute ya. O kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere.

20. Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu: onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu.

21. N'etiti ndikom atọ ahu anāsọpuru ya kari abua fọduru, o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu.

22. Benaia nwa Jehoiada, nwa nke nwoke bu dìnkpà nke Kabzeel, onye di uku n'ime ihe, onye ahu tib͕uru umu-ndikom abua nke Ariel nke Moab: onye ahu rida-kwa-ra tib͕ue ọdum n'etiti olùlù n'ubọchi snow nēzò.

23. Onye ahu tib͕u-kwa-ra nwoke ahu, bú onye Ijipt, nwoke toro ogologo, cubit ise; ube di kwa n'aka onye Ijipt ahu dika oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà; ma o ji nkpa-n'aka ridakuru ya, napu ube ahu n'aka onye Ijipt n'ike, were ube-ya b͕ue ya.

24. Ihe ndia ka Benaia nwa Jehoiada mere, we nwe aha n'etiti ndi-dike atọ ahu.

25. Le, anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu: Devid we do ya onye-isi ndi nānu okwu-ya.

26. Ndi-dike nke usu nile nke ndi-agha kwa; Asahel nwa-nne Joab, Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem;

27. Shamot onye Haroa, Hilez onye-Pelonait;

28. Ira nwa Ikesh onye Tekoa, Abieza onye Anatot;

29. Sibekai onye Husha, Ilai onye Ahoa;

30. Maharai onye Netofa, Hiled nwa Beana onye Netofa;

31. Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin, Benaia onye Piraton;

32. Hurai nke miri-iyi Gaash, Abiel onye Araba;

33. Azmavet onye Bahurim, Eliahba onye Shaalabin;

34. nke umu Hashem onye-Gaizonait, Jonatan nwa Shagei onye-Hararait;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 11