13. Ihere Kemosh gēme kwa Moab, dika ihere Bet-el, bú ihe-ntukwasi-obi-ha, mere ulo Israel.
14. Ùnu si aṅa si, Ndi-dike ka ayi bu, na ndi bu dìnkpà ibu agha?
15. Emebiwo Moab, obodo-ya nile akwugowo kwa n'anwuru-ọku umu-okorọbia-ya arọputara arọputa aridawo kwa n'ob͕ub͕u, ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.
16. Nhuju-anya Moab di nso ibia, ihe ọjọ ya nēme kwa ngwa nke-uku.
17. Gosinu ya ebere unu nwere n'aru ya, unu ndi nile ndi nọ ya buruburu, na unu nile ndi mara aha-ya; sinu, Èsi aṅa b͕aji nkpa-n'aka di ike, bú ndele mara nma?
18. Si na nsọpuru-gi rida, nọdu ala n'akpiri-ikpọ-nku, gi ada nke bi na Dibon; n'ihi na onye nāpunara Moab ihe-ya arigowo imegide gi, o biliwo ebe-gi nile ewusiri ike.
19. Guzo n'uzọ, che nche, gi nwanyi bi n'Aroa: jua onye nāb͕alaga na nwanyi nke nēwepuga onwe-ya; si, Gini mere?