17. Onye nēmeso nkpuru-obi-ya ezi ihe ka onye-ebere bu:Ma onye nēmekpa anu-aru nke aka ya aru ka onye nēnweghi obi-ebere bu.
18. Onye nēmebi iwu nāluta ego-ọlu okwu-ugha:Ma onye nāgha ezi omume dika nkpuru nāluta ugwọ-ọlu kwesiri ntukwasi-obi.
19. Onye nēguzosi ike n'ezi omume gēru na ndu:Ma onye nāb͕aso ihe ọjọ gēru n'ọnwu nke aka ya.
20. Ihe-árú n'anya Jehova ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'obi bu:Ma ihe nātọ Ya utọ ka ndi zuru okè n'uzọ-ha bu.
21. Site n'aka rue aka, agaghi-agu onye ọjọ n'onye nēmeghi ihe ọjọ:Ma nkpuru ndi ezi omume gēwepuga onwe-ha.
22. Dika nb͕a-aka ọla-edo n'imi ezì,Otú a ka nwanyi mara nma nke nēsi n'ezi uche wezuga onwe-ya di.
23. Ihe ndi ezi omume nāchọsi ike bu nání ezi ihe:Ma olile-anya nke ndi nēmebi iwu bu nrubiga-ókè nke iwe.
24. O nwere onye nāghasa aghasa, ma anọ̀ nātukwasiri ya ihe kari;O nwe-kwa-ra onye nēb͕ochi eb͕ochi kari nke ziri ezi, ma ọ nēdubà nání n'ikọ-ukọ.
25. Nkpuru-obi nke nāgọzi agọzi ka agēme ka ọ ma abuba:Ọzọ, onye nēme ka ndi ọzọ ṅujue afọ, agēme kwa ka ya onwe-ya ṅujue afọ.
26. Onye nēb͕uchi ọka, ọra madu gākọcha ya:Ma ngọzi n'isi onye nēre ya.
27. Onye nāchọsi ezi ihe ike nāchọ ka ihe-ya nātọ Chineke utọ:Ma onye nāchọ ihe ọjọ, ihe ahu gābiakute ya.
28. Onye nātukwasi obi n'àkù-ya, onye ahu gāda:Ma dika akwukwọ ndu ka ndi ezi omume gēpú.
29. Onye nēmekpa èzí-na-ulo-ya aru gēketa ifufe:Orù ka onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya gābu-kwa-ra onye obi-ya mara ihe.