1. Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, ekwuwo,We kpọ uwa site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya.
2. Site na Zaion, bú ebe mazuru nma,Ka Chineke nwuputaworo ka ìhè.
3. Ka Chineke-ayi bia, Ya ab͕a-kwa-la nkiti:Ọku nēripia n'iru Ya,Buruburu Ya ka ifufe nēfesi kwa ike nke-uku.
4. Ọ nākpọ elu-igwe nke di n'elu òkù,Nākpọ kwa uwa, ka O we kpe ndi-Ya ikpe:
5. Chikọtaranum ndi-eberem;Bú ndi Mu na ha b͕ara ndu n'elu àjà.
6. Elu-igwe nēgosi kwa ezi omume-Ya;N'ihi na Chineke onwe-ya nēkpe ikpe. Selah
7. Nuru, ndim, M'gēkwu kwa;Nuru, Israel, M'gāb͕a kwa àmà megide gi:Chineke, bú Chineke-gi, ka M'bu.
8. Ọ bughi n'ihi àjà-gi nile ka M'nābara gi nba;Àjà-nsure-ọku-gi nile di kwa n'irum mb͕e nile.
9. M'gaghi-anara oke-ehi n'ulo-gi,M'gaghi-anara nkpi ọ bula n'ogige-ewu-na-aturu-gi.
10. N'ihi na Mu nwe anu-ọhia ọ bula nke oké ọhia,Ya na anu nile n'elu nnù ugwu abua na ọgu iri.
11. Amawom anu-ufe ọ bula nke ugwu nile:Anu nile nke nēnughari n'ọhia di kwa n'akam.