Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 8:29-39 Bible Nso (IGBOB)

29. Mọ Nsọ we si Filip, Jekuru ub͕ọ-ala ahu, nọnyaba kwa ya nso.

30. Filip we b͕akuru ya, we nu ya ka ọ nāgu akwukwọ Aisaia onye-amuma, o we si, Ì nāmata ihe i nāgu?

31. Ọ si, É-è, n'ihi na #m'gēsi aṅa pu imata, ma ọ buru na ọ dighi onye gēdum? O we riọ Filip ka ọ rigota, ka ya na ya nọdu.

32. Ma ibe ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke ọ nāgu bu nka,Esekpuru Ya, dika aturu, je ob͕ub͕u;Dika nwa-aturu da-kwa-ra ob͕i n'iru onye nākpacha ya aji,Otú a ka Ọ nādighi-asaghe ọnu-Ya:

33. Ewepuru ikpé-Ya nime ọnọdu-Ya di ala:Ònye gākọ ọb͕ọ Ya?N'ihi na anēwepu ndu-Ya n'uwa.

34. Onozi ahu we za Filip, si, Ariọm i, ònye ka onye-amuma nka nēkwu okwu a bayere? ọ̀ bu ya onwe-ya ma-ọbu onye ọzọ di iche?

35. Filip we saghe ọnu-ya, zì ya ozi ọma Jisus, nāmalite site n'ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ.

36. Ma mb͕e ha nāga n'uzọ, ha biaruru otù miri; onozi ahu we si, Le, miri; gini nānapu imem baptism?

37. Filip we si ya, Ọ buru na i ji obi-gi dum we kwere, agēme gi. O we za, si, Ekwerem na Jisus Kraist bu Ọkpara Chineke.

38. O we kwue ka ub͕ọ-ala-ya guzo: ha abua we rida na miri, ma Filip ma onozi ahu; o we me ya baptism.

39. Ma mb͕e ha siri na miri rigota, Mọ nke Onye-nwe-ayi wepuru Filip; onozi ahu ahughi kwa ya ọzọ, n'ihi na ọ nāga n'uzọ-ya nāṅuri ọṅu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 8