Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 7:34-39 Bible Nso (IGBOB)

34. N'ezie ahuwom ihe ọjọ anēme ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam isu-udè-ha, M'we ridata iweputa ha: ub͕u a bia kwa, M'gēziga gi n'Ijipt.

35. Moses nka, onye ha juru aju, si, Onye mere gi ka i buru onye-isi na ikpé? onye a ka Chineke ziteworo ibu onye-isi, ibu kwa onye-nb͕aputa, ya na aka mọ-ozi ahu nke emere ka ọ hu ya n'osisi ntà ahu.

36. Nwoke a duputara ha, mb͕e ọ lusiri ọlu-ebube di iche iche na ihe-iriba-ama di iche iche n'Ijipt, na nime Oké Osimiri Uhie, na nime ọhia ọgu arọ abua.

37. Onye a bu Moses ahu, onye siri umu Israel, Chineke gēme ka Onye-amuma, Nke di ka mu onwem, biliere unu site n'etiti umu-nne-unu.

38. Nwoke a bu onye nānọri nime nzukọ n'ọhia, ya na mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu n'ugwu Sainai, na nna-ayi-hà: onye nara okwu di ndu nke si n'ọnu Chineke puta inye ayi:

39. onye nna-ayi-hà nāchọghi iṅa nti, kama ha nupuru ya n'ebe ha nọ, we laghachi azu n'Ijipt n'obi-ha,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 7